onye egwu Naijiria, onye na-ede abụ, onye na-agụ egwú, na onye na-eme ihe nkiri From Wikipedia, the free encyclopedia
Ladipo Eso nke a maara dịka Ladipoe ma ọ bụ Poe bụ onye egwu Naịjirịa.[1] Na 28 Febụwarị 2017, Ladipoe bịanyere aka na nkwekọrịta ndekọ na Mavin Records.[2] Ọ ghọrọ onye a ma ama na egwu "Feel Alright" ebe SDC "Show Dem Camp" gosipụtara ya.[2] O weputara egwu ọhụrụ "Jaiye" na Machị 2019 tupu ọ hapụ egwu a, "Know You" nke onye na-agụ egwu Joromi nke Naijiria, Simi. Ọ bụkwa onye otu nnukwu ìgwè Naịjirịa bụ Collectiv3.
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Ladipo |
ụbọchị ọmụmụ ya | 29 Eprel 1992 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa, Asụsụ Yoruba |
ebe agụmakwụkwọ | Nort Kárólínạ, University of North Carolina |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2014 |
agbụrụ | Ndi Yoruba |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | agba aja aja |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ngwa egwu | olu egwụ, Piano |
ụmụ amaala ka | Ȯra Osun |
ụdị | African popular music, Afrobeats |
akara ndekọ | Mavin Records |
asụsụ eji dee ọrụ | Bekee |
Ihe nrite | The Headies |
ahọpụtara maka | BET Hip Hop Awards |
webụsaịtị | https://www.ladipoe.com/ |
A mụrụ Ladipoe ma zụlite ya na Lagos . Ọ gara Mahadum nke North Carolina na Pembroke na-amụ ma Biology & Chemistry. Ọ bụ n'ebe ahụ ka ọ banyere n'egwú ma soro ndị enyi ya Jeffrey na Kurt guzobe otu Lyrically Equipped .[3] Don Jazzy bịanyere aka na Mavin Records n'afọ 2017.[2]
Poe bụ onye rapa mbụ bịanyere aka na Mavin Records ebe ọ bụ na ọ gbanwere aha na 2012 site na Mo'Hits . Poe dekọrọ egwu mbụ ya n'okpuru akara "Man Already" nke Altims mepụtara. Poe sitere n'ike mmụọ nsọ Slum Village, Lupe na Little Brother.[3]
Egwu ya nke afọ 2021, "Feeling" nke gosipụtara Buju ruru n'ọkwa nke mbụ n'ime chaatị TurnTable Top 50 ugboro atọ.[4] O mere "Feeling" na mmeghe ngosi nke oge nke isii nke Big Brother Naija . Egwu a, “Feeling’ ghọrọ egwu, ọ kụrụ ọbụna klọb na South Africa ma ka bụ abụ Afrịka kachasị amasị ndị mmadụ na ịntanetị ugbu a.[5]
Mgbe a jụrụ ya n'ọnwa Nọvemba afọ 2021, otú o si zụlite ọrụ egwu ya na gburugburu ebe obibi egwu rap enweghị ekele, Ladipoe gwara The Guardian Nigeria, na a gwara ya mgbe ọ malitere njem egwu ya na rapping enweghị isi na Nigeria nke ahụ bụ mgbe ọ wepụtara 'Feeling,' egwu o gosipụtara Buju. onye na-agụ egwu ahụ anọgidewo na-atụgharị uche na mgba ya na ụlọ ọrụ egwu, ọbụlagodi ka ọ na-aga n'ihu na-ekwu na ihe ịga nke ọma ya sitere n'ekpere Chineke.[6]
Talk About Poe (2019)[10]
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.