Kiki Omeili

Onye na-eme ihe nkiri Naijiria From Wikipedia, the free encyclopedia

Kiki Omeili
Remove ads
Remove ads

Nkiruka 'Kiki' Omeili Audio  bụ onye na- eme ihe nkiri na Nigeria, nke a ma ama maka ọrụ ya dị ka Lovette na ịhe nkiri TV a nakpọ Lekki Wives . [1] A makwaara ya maka ọrụ ya na ịhe nkiri dị ka Blessing na ịhe oyoyo a kpọrọ 2015 crime caper, Gbomo Gbomo Express na Gideon Okeke .

Ozi ndị ọzọ Ụlọ ọrụ mmepụta ihe, ụdịekere ...
Kiki Omeili
Thumb
Thumb
Kiki Omeili, 2018
Remove ads

Ndụ mbido

A mụrụ Omeili na Lagos, ọ bụkwa nwa nke abụọ n’ime ụmụ anọ Charles na Maureen Omeili mụrụ. O bu onye Igbo si Nimo na Anambra State . Nna ya Charles bụ onye na-arụ ọrụ n'ụlọ akụ First Bank Nigeria ma la ezumike nká dịka onye isi njikwa, ebe nne ya bụ Maureen bụ onye njikwa nke ụlọ mkpọrọ na Ibadan, Oyo State, Nigeria. Omeili bidoro ime ịhe nkiri stage plays site n ’ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị. Nke a gara n'ihu mgbe ọ banyere mahadum mgbe ọsoyere otu ndi na eme ịhe egwuriegwu ma soro me ihe ejije dị iche iche yana isonye n'ọtụtụ asọmpi ejije. N'afọ 2006, ọ nwetara nzere dibia oyibo na mahadum , University of Lagos . [2]

Remove ads

Ọrụ

N'afọ 2011, Omeili soro ndi e nyochara ma nweta ọrụ Debbie na ịhe oyoy TV "Behind the Smile". N’afọ 2012, ya na onye isi ‘’ Behind the Smile ’’, Tunde Olaoye, jikọrọ aka wee pụta n’ihe nkiri sinima izizi ya okporo “Married but living single” ebe ya na Funke Akindele, Joseph Benjamin, Femi Brainard na Joke Silva rụkọrọ ọrụ. [3] Omeili enweela ọrụ n'ọtụtụ usoro TV gụnyere "The Valley Between", [4] "NESREA Watch", "Lekki Wives" na "Gidi Culture".

Na mgbakwunye na ọrụ ọ na-arụ, na 2011 Omeili bido emume etemegwu na oyoyo "Dance 234", [5] bụ ihe nkiri ntụrụndụ ndị Koga. Omeili na-akwadokwa ngalaba ahụike na Smooth FM nke ụtụtụ Satọdee ngosipụta akpọrọ "Balancing Life" ma dee ọtụtụ akụkọ na blọọgụ n'ịntanetị.

Kiki Omeili a nakpokwa "emcees" na eme ihe omume dị iche iche dika ịkwuputara ndị olu-oru okwu gụnyere LG na ịhe omume MTN gbasara asumumpị ball uwa nke 2009.

Na Ọgọstụ 2013, ekwuputara na a ga-ebido Lekki Wives maka oge nke abụọ wee megharịrị nkwekọrịta ha na Omeili were iji weghachi ọrụ ya dị ka Lovette. [6]

Na mbido afọ 2016, ọsoro mee ka ịhe nkiri oyoyo wuruewu a na - akpọ Couple of Days, ebe ọ na-egosipụta àgwà Joke, nwetara nlele dị ebube site na ndị nkatọ. Na Mee 2016, Iterum obere ihe nkiri nke Stanlee Ohikhuare duziri na nke Kiki Omeili na Paul Utomi na-egosi na 69th Annual Cannes Film Festival. [7]

Na May 31, 2016, Omeili mere ihe nkiri izizi ya mge O mwepụta ịhe nkiri perempe nke a nakpọ Unprotected . [8] Ihe nkiri a dabere na ihe ndị mere eme, nke ọ hụrụ dị ka nwa akwụkwọ na mahadum. Ihe nkiri ahụ nwere Kiki Omeili, dị ka onye ndu, na Eric Olee, Bimbo Ademoye, Blessing Ambrose na Nathan Kingsley na-akwado ọrụ. [9]

N’ọnwa Juunu nke afọ 2018, Omeili bidoro mepụta ihe nkiri nkiri zuru ezu nke izizi ya bụ Run, nke Uche Chukwu duziri. [10] Emepụtara ihe nkiri Run na cinemas na Ọgọstụ 23 2019 nke ndị soro mee ya bu Owen Gee, Rotimi Salami, Kelechi Udegbe, na Greg Ojefua. [11] [12] A họpụtakwara ya bu ịhe nkiri wee gosị ya na Silicon Valley International Film Festival dị na California na Slum International Film Festival dị na Kenya. Ọ natara onyinye na Toronto International Nollywood Film Festival dị na Canada. [13]

Remove ads

Onyiye na nturu ugo

N'ọnwa Ọktọba 2012, Omeili nwetara onyinye maka 'Best Actress (Supporting role in an English language film)' na 17th African Film Awards (nke a na-akpọbu Afro Hollywood Awards) na London. [14]

N’ọnwa Mee afọ 2014, Omeili so na ndị edepụtara afa fa na Top 25 New Faces of Nollywood na akwụkwọ akụkọ Nigerian Entertainment Today (NET), [15] Ndị akwụkwọ akụkọ asiri 'Sun' dekwara ya dịka otu n'ime kpakpando kachasị ọsọsọ na Nollywood na mbido 2014. [16]

A hoputara Omeili dika 'TV Actress of the Year' nke ndị Exquisite Lady of the Year (ELOY) Award na November 2014. A hoputara ya maka ịhe ọmere na n’usoro ihe nkiri oyonyo ‘Lekki Wives’.

N’ọnwa Ọktọba afọ 2015, Omeili ritere nturuugo maka onye na-akwado ihe nkiri kacha mma maka ọrụ ya na ịhe nkiri - Sting, di na 2015 Global Icons Academy Movie Awards (GIAMA), nke emere na USA. [17]

Na onwa Julai 2016, Omeili ritere nturu ugo maka onye kacha kwado ihe nkịrị n’aho [18] na 2016 City People Entertainment Awards na Lagos, Nigeria.

N'ọnwa Ọktọba 2016, a họpụtara Omeili maka Onye Nduzi Nwanyị Kachasị Mma na ịhe nkiri pere mpe na Berlin 2016 - Film Fest International Awards maka ọrụ ya na ịhe nkiri, Deluded . [19]

Omeili, ka ekpughere dị ka onye nnọchi anya na 2017 Realtime film festival iji kwanyere ya ugwu na ọrụ ọ na arụ na ihe nkiri nke Nigeria. [20]

Na 2018, Omeili nwetara onyinye kacha mma maka nwayị rụrụ orụ ka ọye nkwado na World Music and Independent Film Festival, nke emere na Caribbean Islands maka ọrụ ya na ihe nkiri 3Some . [21] N’otu afọ ahụ, a họpụtakwara ya maka Best Actress na Realtime film festival.

Ọrụ Nyemaka

Omeili etinyela aka na ọrụ enyemaka na Project Pink Blue . O bu ụzo na ije mmuta maka ọria kansa esi na ya na ayo ego ịji enyere ndi otu na akwado ndị na arịa orị cancer site na mgbasa ozi na ihe omume. [22] [23] [24]

Ịhe nrite

Ozi ndị ọzọ Afọ, Mmemme ...
Remove ads

Ihe nkiri

Ozi ndị ọzọ Year, Title ...
Remove ads

Ebe nsi nweta

Loading related searches...

Wikiwand - on

Seamless Wikipedia browsing. On steroids.

Remove ads