Israel Oludotun Ransome-Kuti
From Wikipedia, the free encyclopedia
Remove ads
Israel Oludotun Ransome-Kuti (30 Eprel 1891 na 6 Eprel 1955) bụ onye ụkọchukwu Naijiria na onye nkuzi.[1][2]
Remove ads
Ndụ
A mụrụ Israel na 30 Eprel 1891 na Abeokuta, Ogun Steeti na Josiah Ransome-Kuti na Bertha Anny Olubi. Ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị na sekọndrị na Lagos Grammar School na Abeokuta Grammar School n'otu n'otu tupu ọ gaa Fourah Bay College, Freetown ebe ọ gụsịrị akwụkwọ.[3]
Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na Fourah Bay Koleeji, Israel laghachiri Naijiria na 1916 iji malite ọrụ ya dị ka onye nkuzi klas na Abeokuta Grammar School ruo 1918 mgbe ọ hapụrụ obodo ya.[4] A họpụtara ya dị ka onye isi nke Ijebu Ode Grammar School ruo afọ iri na atọ wee gaa n'ihu guzobe Association of Headmasters of Ijebu Schools na 1926.
N'afọ 1931, a họpụtara Israel dị ka onye isi oche nke Union of Teachers nke Naijiria nke e guzobere ọhụrụ n'oge ahụ, ọkwá ọ nọ na ya ruo mgbe ọ lara ezumike nká n'afọ 1954.[5] Kuti Hall, otu n'ime ụlọ obibi na Mahadum Ibadan nke meghere na 1954, a na-akpọ ya Israel Oludotun Ransome-Kuti.[6]
Remove ads
Ọnwụ
N'abalị isii n'ọnwa Epreel n'afọ 1955, Israel nwụrụ n'ọrịa cancer n'ụlọ ya dị na Abeokuta, Ogun Steeti.[7]
Akwụkwọ
Wikiwand - on
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Remove ads