Onye nduzi egwu vidyo Naijiria From Wikipedia, the free encyclopedia
Clarence Peters Audio (onye amụrụ Clarence Abiodun Peters) bụ Nigerian music video director, onye mmepụta ihe nkiri fim na cinematographer . Ọ bụ ya guzobere ụlọ ọrụ '' Capital Dream Pictures'' production company nke na ahụ maka performing arts fim nakwa ihe nkiri vidio. O guzobekwara ụlọ ọrụ ọzọ a kpọrọ Capital Hill Records, ụlọ na- ahụ maka ndi na-eti egwu bụ nke nwaada Chidinma, Tha Suspect na Illbliss so na ya . [1] [2] A họọrọ ya dika onye nke abụọ n'ime mmadụ iri aha ndi Channel O' wepụtara gbasara ndị daịrektọ nwere ọhụrụ banyere iti egwu nakwa imeputa vidio egwu ahụ. [3] N'afọ 1998, o sonyere ma kwado vidio egwu nke Mobil bụ nke metụtara ọria AIDS. Ọ haziri ihe nkiri a kpọrọ ''Everyday people'' nwere nkeji iri anọ n'onyonyo . [4] Peters ahiziela vidio egwu ndi na-eti egwu di iche iche ụfọdụ gụnyere Darey, Durella, na Wizkid, . [5] N'afọ 2012, o gosịri vidio egwu maka Shuga', nke Boneye ji P-Unit wee dokwara,Banky W., Wizkid and L-Tido . [6] Peters egosipụtala ihe akụkọ mere eme dị iche iche dị utọ n'onyonyo, ihe ngosi maka azụmahịa, nkenke fim nakwa ihe ndị ọzọ[7] N’April 2014, Absolut Vodka kwanyere ya ugwu maka nka ọrụ aka ya. [8]
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Clarence |
aha ezinụlọ ya | Peters |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20. century, 27 Julaị 1978 |
Ebe ọmụmụ | Ibadan |
Ńnà | Sir Shina Peters |
Ńné | Clarion Chukwurah |
ọrụ ọ na-arụ | onye nhazi ndu ihe nkiri, onye nhazi-foto, filmmaker |
ebe agụmakwụkwọ | Government College Ikorodu |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1998 |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
N'ọnwa Septemba n'afọ 2015, Peters kwupụtara ebumnuche ya maka ngosipụta ihe nkiri fim na-eyi egwu dị nkeji iri abụọ na ise akpọrọ Hex . E wepụtara nkeji nke izizi na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na asatọ n'ọnwa September n'afọ, 2015.
A mụrụ Peters n'ezinụlọ ndị ama ama bụ Sir Shina Peters,oti egwu na Clarion Chukwura, onye na-emepụta ihe nkiri egwuregwu n'onyonyo.. Ọ gụrụ praịmarị ya n' ụlọ akwụkwọ praịmarị BI, gụọ sekọndịrị na Government College Ikorodu . Mgbe ọ gụsịrị sekọndrị, ọ rụrụ ọrụ afọ atọ n'ụlọ ọrụ Alpha Visions . Ọ gụrụ na City Varsity, ụlọ akwụkwọ dị na Cape Town South Afrika bụ na -akụzi maka ihe niile gbasara fim.. Ọ gụrụ ihe gbasara sinimatografi n'ụlọ akwụkwọ a. [9] Mgbe ọ na-eto , Peters bụ onye ọgbaa bọọlụ. [10] N'ajụjụ ọnụ etinyere n'akwụkwọ akụkọ Daily Times of Nigeria webụsaịtị, Nne ya kwuru na ya chọrọ itepụ afọ ime ya mana tụgharia uche maka na o kwenyere na Peters bụ Nna ya nwụrụ anwụ lọọrọ ya ụwa mgbe ọ dị afọ iri na otu. [11] Mgbe o si South Africa laghachiri Naịjirịa , Peters sonyere ndị otu na-eme ihe nkiri fim wee guzobe ụlọ ọrụ akpọrọ Alliance Film Company, nke eji Allied Film Company mara. Peters rụrụ ọrụ n'ụlọ ọrụ a otu afọ tupu o wee guzobe nke ya. Peters akpọwo Steven Spielberg, Hype Williams, DJ Tee, Akin Alabi, Wudi Awa, HG2films, Director dove Kemi Adetiba, Sesan, Aje, and AK 1 dika ndị ọ na eṅomi. [12]
Mgbe Peters nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ọ zutere Tha Suspect, Ya na ya bụ enyi ma gụzobe otu Capital Hill bụ nke Peters guzobere na Nigeria mgeb osi South Africa lọta. Ya na Suspect kpebiri ịchọ nwata nwaanyi maara agụ egwu. E mechara Peters chọta Kel onye nke Terry tha Rapman gwara ya maka ya . Ya na Kel binye aka n'akwụkwọ irụkọ ọrụ. [1] N'ọnwa Septemba afọ 2010, Kel na Peters nwere nghọtahie, nke mere ka ọ kwụsị nkwekọrịta na nkwado ya . Kel jisiri ike wepụta album egwu izizi ya, The Investment, . [13] N'ikpeazụ ya na ụlọ ọrụ ọzọ bụ Goretti Company,rụkọrọ bụ nke Illblissnwe.
Na Jenụwarị afọ 2014,amara ya ikpe gbasara [14] maka egwu nke Tiwa Savage's "Eminado o mere na vidio. O zuru at umatụ ngosi nke "Asinamali" nke Tumi and the Volume weputara iji kwanyere Seydou Keïta. Tumi ugwu. Seydou Keïta gara na twitter kwutọọ Peters . Ọ gbara ndị enyi ya ka ha tinye ọnụ n'okwu ahụ. [15] Onye nledo Savage, Tunji "Tee Billz" Balogun, tinyer ọnụ n'okwu ahụ . O kwuru na ha amaghi na vidio ahụ ṅuomi vidio onye ọzọ na ọ tụr u ha n'anya dika o si tụọ mmadụ niile. [16]
Ka egosipụtara vidio nke Ice Prince's "VIP ka ọnwa Jun di na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na otu n'afọ 2013, eboro Peters ebubo ọzọ gbasara ṅuomi onye Slaughterhouse's "My Life" n'ụdị ezighị ezi . [17] Na Febuwarị afọ 2014, Ice Prince gbachitere Peters wee kwuo na ọ bụ ya gwara ya echiche ndị otinyere na egwu ya. O kwukwara na ọ bụrụ na enwere onye nwere nsogbu na ọnọdụ a, na onye ahụ taa ya ụta. [18]
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.