onye egwu na onye na-ede abụ From Wikipedia, the free encyclopedia
Oladipo Olamide Emmanuel (amụrụ ya na 13 septemba1993), onye amaara ama dika Chinko Ekun, bu onye na-eti egwu na onye na ede egwu Naịjirịa. [1]
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha pseudonym | Chinko Ekun |
ụbọchị ọmụmụ ya | 13 Septemba 1993 |
Ebe ọmụmụ | Ikeja |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Asụsụ Yoruba, Bekee, pidgin Naịjirịa |
Ọrụ ọ na-arụ | rapper, onye na-abụ abụ, onye ọka iwu, odee egwu |
ebe agụmakwụkwọ | Mahadum Obafemi Awolowo |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2011 |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ngwa egwu | olu egwụ |
ụdị | egwu hip hop |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
A mụrụ Chinko Ekun na Ikeja, Legọọsụ Stee
ti, Naịjirịa, n'ime ezinụlọ dị atọ, ebe ọ bụ nwa nke abụọ. [2] Ọ bụ nwa afọ Ikare, Ondo Steeti, Naịjirịa. [3] Chinko Ekun gara Blessing Nọsịrị na Praịmarị Sukulu, Oshodi, Legọọsụ Steeti na Remade Nọsịrị na Praịmarị Sukulu, Igando, Legọọsụ Steeti. Ọ gara Baptist Model High Sukulu, Ijegun, Legọọsụ Steeti maka ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ọ gụsịrị akwụkwọ na ogo na Mahadum Obafemi Awolowo. [4] Ọ gara obodo nna ya ozi na Legọọsụ Steeti. [5]
Mgbe Chinko Ekun dị afọ asaa, ọ malitere inwe mmasị n’egwú. N’afọ mbụ ya na mahadum, o nwere mmasị na azụmahịa na egwu rapụ. [6] Chinko Ekun ji ikike ya bido ọrụ egwu ya n’afọ 2011, ọ na-egosi vidiyo egwu ya na Instagram. N’afọ 2013, o weputara “Ekun” dika egwu izizi ya. N’afọ 2014, Chinko Ekun pụtara na abọm egwu Olamide "Street OT", n’ime egwu “100 To Million”, “Bang” na “Usian Bolt” [7] Ọ pụtara na "Olamide Live In Concert"(OLIC) 2014, ebe ọ rụrụ ọrụ firistaịlụ. [8] Chinko Ekun gụrụ egwu na Bekee, Pidgin na Yoruba, na-elekwasị anya na egwu hipu họpụ. Aha ya "Chinko Ekun" site n'okwu abụọ "Chinko" na "Ekun". "Chinko", n'ihi na a gwara ya na ọ dị ka onye China n'oge ọ nọ na mahadum na "Ekun", n'ihi na ọ bụ egwu mbụ ya. [9]
N'afọ 2015, Chinko Ekun sonyeere ' YBNL Nation ' nke Olamide. [10] Ọ wepụtara ọkwa izizi ya nke akpọrọ "Alejo Oran" na "Emi Na Re" site na YBNL Nation na 25 Febuwarị 2015. [11] Ka otu afọ gachara, ọ hapụrụ aha ndekọ ahụ mgbe nkwekọrịta ya gwụchara, ya na ndị ọrụ ibe ya Adekunle Gold na Viktoh. [12] Na 2017, o sonyeere Dek-Niyor Entertainment, ndekọ lebeelụ na Dubai. [13]
Na 13 Septemba 2018, ọ wepụtara egwu nke akpọrọ "Able God" nke gosipụtara Zlatan na Lil Kesh. [14] Egwú ahụ nyere ya ihe nrite Headies mbụ ya dịka "Best Street Hop Artiste" na The "Headies" 2019. [15] Egwu a natara nhọpụta nke "Popular Song of the Year" na 2019 "City People Music Awọdụ". [16] Ọ meriri "Street Song of the Year" na 2019 "City People Music Awọdụ. [17]
Chinko Ekun alụbeghị nwanyị ma kpughee na ya adịbeghị njikere maka alụmdi na nwunye. [18]
Aha | Afọ |
---|---|
"Ekun" | 2013 |
"Emi na re" | 2015 |
"Alejo Oran" | 2015 |
"Jen le yo" | 2015 |
"Binu" | 2016 |
"Bless Me" | 2016 |
"Flenjo" | 2016 |
"Wa Lo Da" | 2017 |
"Gbefun" | 2017 |
"Shake It" | 2017 |
"Shayo" | 2017 |
"Eruku de" | 2017 |
"Yaso" | 2018 |
"Bodija" | 2018 |
"Switch It Up" | 2018 |
"Able God" ft. (Zlatan Ibile and Lil Kesh) | 2018 |
"Calling" ft. (Johnny Drille) | 2018 |
"Semena" ft. (Peruzzi) | 2019 |
"Mafo" | 2019 |
"Party Animal" | 2020 |
Afọ | Onyinye | Afọ | Onye nnata | Nsonaazụ | Ref |
---|---|---|---|---|---|
2020 | Akara MVP nke Soundcity | Nhọrọ nke ndị na - ekiri ya | style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara | [19] | |
2019 | Obodo ndị mmadụ Music Awards | Egwu okporo nke afọ | "Able God" | Merie | [17] |
Egwu ama ama nke afọ | style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara | [16] | |||
Egwu amaala kacha mma nke afọ | style="background: #FDD; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="no table-no2"|Ahọpụtara | ||||
Isi | Egwu họpụ kacha mma | style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie | [20] |
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.