onye na-abụ abụ na onye na-ede abụ Naijiria (amụrụ 1991) From Wikipedia, the free encyclopedia
Damini Ebunoluwa Ogulu (amuru na abali abuo nke Julai 1991), onye ama ama Burna Boy, bu onye oti egwu na onye na ede egwu nke ndi Naijiria.[1] O bilitere bụrụ onye a ma ama na 2012 mgbe o wepụtara "Like To Party", egwu izizi si na L.I.F.E (2013). N'afọ 2017, Burna Boy bịnyere aka na nkwekọrịta Bad Habit / Atlantic Records, nakwa Warner Music Group mba ụwa. Ewepụtara album ya nke atọ Outside na 2018.[2]A tọhapụrụ album nke anọ ya African Giant na July 2019. Burna Boy, onye nke tipụtere egwu wụrụ ewụ dika "Ye", "On The Low", "Anybody", ritere nturugo BET International Act n'afọ 2019.
Burna Boy | |
---|---|
Múrú | Damini Ebunoluwa Ogulu Julai 12, 1991 Ụgwu Ọcha, Naijiria |
Orü | Onye na agụ egwu |
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
Aha ọmụmụ | Damini Ebunoluwa Ogulu |
Aha enyere | Damini |
aha ezinụlọ ya | Ogulu |
aha pseudonym | Burna Boy |
ụbọchị ọmụmụ ya | 2 Julaị 1991 |
Ebe ọmụmụ | Port Harcourt |
Ńnà | Samuel Ogulu |
Ńné | Bose Ogulu |
nwanne | abụo |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa, Asụsụ Yoruba |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, odee egwu, onye egwu, onye na-emeputa ihe ndeko |
ebe agụmakwụkwọ | University of Sussex, Oxford Brookes University |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2010 |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ngwa egwu | olu egwụ |
diskografi | Burna Boy discography |
Ọrụ ama ama | African Giant |
ụdị | Afrobeat, dancehall, reggae, egwu hip hop, rhythm and blues |
akara ndekọ | Atlantic Records, Warner Music Group |
webụsaịtị | https://www.onaspaceship.com/ |
kọwara na URL | https://www.tekstowo.pl/wykonawca,burna_boy.html |
Agbụrụ | Asụsụ Yoruba |
nnọchiaha nkeonwe | L485 |
A mụrụ Damini Ogulu na Port Harcourt, Naịjirịa.[3] Nna ya na-ahụ maka ụlọ ọrụ ịgbado ọkụ ma nne ya na-arụ ọrụ dịka onye ntụgharị. Nna nna ya Benson Idonije bụbu onye njikwa Fela Kuti.[4] Ogulu toro na (5)Naijiria ebe ọ malitere iwepụta egwu nke ya site na enyemaka nke Fruity Loops.[5]Ọ gụchara ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị nso na Lagos wee gawa London maka agụmakwụkwọ ọzọ.
Aristokrat Records weputara efere egwu izizi Burna Boy bụ L.I.F.E na ọnwa Ọgọọst 12, 2013. Ọ na-edochi mixtape nke abụọ ya bụ Burn Identity nke pụtara n'afọ 2011. L.I.F.E rere nkeji puku iri ano n'ụbọchị izizi ya. Aristokrat Records mechara resi Uba Pacific ikike efere egwu ahụ na ọnụ ihe dịka nde naira iri. E ji egwu dika "Like to Party", "Tonight", "Always Love You", "Run My Race" na "Yawa Dey" were kwado ọba egwu ahụ. Nke Leriq mepụta, enwekwara ndị otiegwu ọzọ pụtara na L.I.F.E dịka 2face Idibia, M.I, Timaya, Olamide, Reminisce na Wizkid. Ọ ghọrọ nọmba 10 na ndepụta Nigerian Entertainment Today nke ọbaegwu iri na abụọ kachasị mma na 2013. L.I.F.E nwere ụdị ụtọ dị ka egwu Fela Kuti, King Sunny Ade na Bob Marley. Anabatakwara ya nke ọma ma too ya maka ụda ya. E depụtara ya maka ọbaegwu kachasị mma n'afọ na mmemme 2014 Nigerian Entertainment Awards. N’ọnwa Ọgọstụ 2013, L.I.F.E ruru nọmba 7 na eserese Billboard Reggae Albums.
N’afọ 2014, Burna Boy gbara arụkwaghịm na Aristokrat Records. Ka afọ abụọ gasịrị, n’afọ 2015, o kpughee ụlọ ọrụ egwu ya akpọ Spaceship Entertainment.
Ọ wepụtara ọbaegwu nke abụọ ya On a Spaceship na 25 Nọvemba 2015. Na Septemba 2016, ọ wepụtara EP nwere egwu asaa akporo Redemption. Isi egwu ọbaegwu ahụ bụ "Pree Me" banyere na Noisey.
Na Jenụwarị 2018, e gosipụtara Burna Boy na "Sunshine Riptide", egwu si na MANIA, ọbaegwu asaa nke Fall Out Boy wepụtara na 2018. Ọ weputara ọbaegwu nke atọ ya Outside na Jenụwarị 26, 2018.
Na 21 Maachị 2019, Burna Boy weputara EP nwere egwu anọ anakpọ Steel & Copper, nke ọ mere, ya na ndi otu egwu elektrọnik si Los Angeles DJDS.
N'ọnwa Juunu 24, 2019, Burna Boy ritere nturuugo onye otiegwu mba ụwa kachasị mma na nturu ugo BET.
Ọ mere "Ja Ara E" nke pụta na ọba egwu Beyonce bụ The Lion King: The Gift. Ọ bụ ya bụ naanị otu onye otiegwu nwere egwu ya n'efere egwu ahụ.
A tọhapụrụ ọba egwu nke anọ ya African Giant na July 2019. E ji egwu dika "Gbona", "On the Low", Killin Dem", "Dangote", "Anybody" na "Pull Up" wee kwado ya.
Ọ malitere irụ ọru n'ọba egwu ahụ n'afọ 2018. Ọ gwara akwụkwọ akụkọ Billboard na ọba egwu ahụ bụ nke kachasị dị ya mkpa. O buru ụzọ kpughee atụmatụ ịwepụta ọba egwu ahụ na Eprel 2019 ma wee nwee nnọkọ ige ntị na Los Angeles.
E kesara foto na vidiyo si na nnọkọ ige ntị ahụ na soshal midia. E buru ụzọ kọwa African Giant dị ka ọba egwu nwere egwu iri na isii. Iji kwalite ọba egwu ahụ, Burna Boy bidoro njem nlegharị egwu akpọrọ African Giant Returns, ngalaba nke abụọ nke njem African Giant. Burna Boy tiri "My Money, My Baby", nke ejiri mee ihe egwu na-akụ n'okirikiri na fim ahụ Queen & Slim.
Burna Boy na-akpọ ụdị egwu ya, Afro-Fusion. Ụdị nke na-agwakọta afrobeat, dancehall riddims, reggae, rap na R&B. August Brown nke akwụkwọ akụkọ Los Angeles Times kwuru na ụda Burna Boy mara mma ma di ohụrụ mana mbọ niile ọ na-agba emeputa egwu na-ewu ewu anaghị adọpụ ya uche.
Afọ | Aha | Ọba egwu | Ọmeputa egwu |
---|---|---|---|
2011 | "Shobeedo" (Freestyle) | Àtụ:N/a | |
2012 | "Like to Party" | L.I.F.E | Leriq |
"Tonight" | |||
2013 | "Run My Race" | ||
"Yawa Dey" | |||
"Celebrate" | rowspan="5" Àtụ:N/a | GospelOnDeBeatz | |
"Won Da Mo" (featuring D'banj) | DeeVee | ||
2014 | "Rockstar" | Leriq | |
"Don Gorgon" | Spellz | ||
"Check and Balance" | |||
2015 | "Soke" | On a Spaceship | Orbeat |
"The Realest" | Simba Tagz | ||
"Rizzla" | J Fem | ||
2016 | "Pree Me"[6] | Redemption | Leriq |
"Mandem Anthem" | rowspan="2" Àtụ:N/a | Fresh | |
2017 | "Hallelujah" | Killbeatz | |
"Rock Your Body" | Outside | Juls | |
"Streets of Africa" | Leriq | ||
"Koni Baje" | P2J | ||
"Sekkle Down" | Jae5 | ||
2018 | "Heaven's Gate" (featuring Lily Allen)[7] | Fred Gibson | |
"Ye" | Phantom | ||
"On the Low"[8] | African Giant | Kel P | |
"Gbona"[9] | |||
"Killin Dem" (featuring Zlatan)[10] | |||
2019 | "Dangote"[11] | ||
"Anybody"[12] | P2J | ||
"Pull Up" | Kel P |
Afọ | Otiegwu | Aha | Ọba egwu |
---|---|---|---|
2013 | Wande Coal | "Amorawa"[13] | rowspan="1"Àtụ:N/a |
Ice Prince | "Gimme Dat" (also featuring Yung L and Olamide) | Fire of Zamani | |
2014 | DJ Spinall | "Gba Gbe E" | rowspan="1"Àtụ:N/a |
AKA | "All Eyes On Me" (also featuring Da L.E.S and JR) | Levels | |
Sarkodie | "Special Someone" (also featuring AKA) | Sarkology | |
2016 | Skales | "Temper" (Remix)[14] | rowspan="2"Àtụ:N/a |
2017 | Airboy | "Ayepo" (Remix)[15] | |
Skales | "Gbefun One Time" | The Never Say Never Guy | |
Jesse Jagz | "Violation" | Odysseus | |
2018 | Four of Diamonds | "Name On It" | Àtụ:TBA |
Fall Out Boy | ”Sunshine Riptide” | Mania | |
Lily Allen | "Your Choice"[16] | No Shame | |
DJ Spinall | "Serious" | Iyanu | |
Larry Gaaga | "Baba Nla" (also featuring 2Baba and D'banj)[17] | Àtụ:N/a | |
Major Lazer | "All My Life"[18] | Africa Is the Future | |
Show Dem Camp | "Legend"[19] | Palm Wine Music 2 | |
Peruzzi | "Champion Lover" | Heartwork | |
2019 | Sauti Sol | "Afrikan Star" | African Sauce |
Dave | "Location" | Psychodrama | |
Mahalia Burkmar | "Simmer" | Love & Compromise | |
Beyoncé | "Ja Ara E" | The Lion King: The Gift | |
DJ Snake | "No Option"[20] | Carte Blanche | |
Jorja Smith | "Be Honest" | Àtụ:TBA | |
IDK | "December"[21] | Is He Real | |
Wretch 32 | "All In"[22] | Upon Reflection | |
Stormzy, Ed Sheeran | "Own It"[23] | Heavy Is the Head | |
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.