onye ọchị ọchị Naijiria From Wikipedia, the free encyclopedia
Bright Okpocha (a mụrụ ya n'abalị iri na anọ n'ọnwa Septemba nke afọ 1978 na Lagos State ), nke e jikarịrị aha okwago ya bu Basketmouth wee mara, bu onye ọkpa ọchị na onye omee ejije nke Naijiria. Ọ haziela egwuregwu a mara ama kwụ ọtọ dị ka Basketmouth Uncensored na mba ụwa.
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 14 Septemba 1978 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Ọrụ ọ na-arụ | omee, onye mkpaochi |
ebe agụmakwụkwọ | Mahadum nke Benin |
webụsaịtị | http://www.basketmouth.tv |
Basketmouth kwadoro ihe ịma aka egwuregwu na Instagram, nke ọ kpọrọ #TwoThingsChallenge nke kpalitere ọgba aghara site n'aka ndị nkiri ya, mgbe ahụ ka otu onye ntorobịa bụ kwa onye nkiri ya wepụtara ihe onyonyo ya na-ekwu okwu rụrụ arụ metụtara mmekọ edina, na nwatakịrị na-ele anya n'ihe onyonyo ahụ. [1]
Ọ bụ ya mepụtara " Ghana Jollof ". [2]
A mụrụ Bright Okpocha na steeti Lagos mana ọ bụ onye steeti Abia, nke Naijiria. Ọ gụchara ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị ya na Apapa, Lagos tupu ọ gaa na mahadum Benin, steeti Edo wee nweta nzere digirii mụọ na Sociology na Anthropology. Ọ chọpụtara nka ya n'ịkụ ịgba n'afọ 1991 ma malite rapịnụ n'afọ 1994. O wee hiwe otu a na-akpọ " Da Psychophats" nke nwere mmadụ asaa wee malite ịga maka ihe nkiri na rapịnụ n'afọ 1995, mana ha kpasara tupu ha ewepụta ihe ọ bụla. Ọ gara n'ihu mee ka ya na nwanne ya nwoke bụ Godwin na Muyiwa Ọla-Phillips guzobe otu rapu ọzọ nke a maara dị ka " Da Oddz": ha mere ihe ngosi ole na ole mana amaghị ha ama n'ihi na ụdị rapụ ha bụ nke anabataghị na Nigeria . [3]
Bright gụchara akwụkwọ praịmarị na sekọndrị na Apapa (Lagos, Nigeria) wee gakwaa n'ihu ịnweta nzere digirii na mahadum Benin ebe ya na nwanne ya nwoke Godwin gụrụ sociology na anthropology. [4]
N'afọ 2000, Basketmouth pụtara n'onyonyo egwu Lagbaja a kpọrọ Gra Gra.
N'afọ 2005 na 2006, Basketmouth meriri National Comedy Award na ihe nrite maka Best Stand-up Comedian of the Year. [5] A họpụtara ya n'afọ 2021 maka The Humor Awards Academy na kwa onye ọkpa ọchị ibe ya bụ Mr Funny . [6]
Basketmouth pụtara na ihe nkiri Magic Africa "My Flatmates" (2016). [7] [8]
Basketmouth nabatara ọkpa akụ ericha ericha bụ Femi Otedola n'ụlọ ya. [9]
N'ọnwa Disemba 2020, ọ malitere usoro ihe nkiri webụ ya nke a kpọrọ " Papa Benji ". [10]
Ọ malitere akara ndekọ Barons World Entertainment n'afọ 2014. [11]
Ọ kụpụtara egwu ọdịnala a kpọrọ 'Yabasi ' dị ka egwu maka ejije'Papa Benji ' na Nọvemba 2020. egwuahụ bụ nke ndị à mà ama dị ka Ladipoe, BOJ, The Cavemen, Bez, Waje, Duncan Mighty, Flavor na Phyno socha n' ime ya. [12]
Basketmouth emeela atụmatụ ma kwuo na o mere obere ihe nkiri Confession of a Bandit ma mee ihe nkiri dị mkpirikpi dị ka Agent Gburugburu ya na ndị òtù ọlụlụ ya na-ewere akụkụ ndị ọzọ iji mee ka ihe nkiri ahụ zuru ezu. [13]
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.