Amina Titi Atiku-Abubakar

Onye ndọrọndọrọ ọchichi na Nigeria From Wikipedia, the free encyclopedia

Remove ads
Remove ads

Amina Titilayo Atiku-Abubakar, Audio bụ nwunye nke onye na-esota onye isi ala Federal Republic of Nigeria, Atiku Abubakar. Ọ bụ onye na-akwado ndị inyom na ụmụaka. Ọ bụ onye guzobere Nzụkọ na-ahụ maka nkụzị gbasara ahia ụmụ nwanyi na ụmụaka 'Women Trafficking and Child Labour Eradication Foundation (WOTCLEF)' na onye malitere[1] iwu nke onwe ya nke mere ka e guzobe 'National Agency for Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP)'.

Ozi ndị ọzọ ụdịekere, mba o sị ...
Amina Titi Atiku-Abubakar
Remove ads

Mbido Ndụ na agụm akwụkwọ

Titi Amina Atiku Abubakar ka a mụrụ n'ebe obibi ndị Kraịst n'ezinụlọ Albert Yoruba nke si Ilesa,[2][3] Osun. Ọ gụsịrị akwụkwọ nke Primari na Sekondiri n' ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ, bụ nke Roman [4] Katọlik nwere. A zụlitere ya na Lagos ma mesịa lụọ Atiku Abubakar, tupu ya agaa Polytechnic Kaduna.[5] E wezụga Bekee, ọ na-asụ asụsụ asụsụ Yoruba na Hausa.[6]

Ọrụ 

Ọ kụziela na [7]Kaduna State Polytechnic

Njem ojere na Rome

Mgbe ọ nọ na Rome ịga n'ihu agụmakwụkwọ ya n'agbata afọ 1986 - 1987, ọ hụrụ ọtụtụ ụmụ nwanyị Naijiria n'okporo ámá. Mgbe ọ jụsịrị ajụjụ, ọ chọpụtara na ihe ka ọtụtụ n'ime ụmụ agbọghọ ahụ na-eje ozi dị ka ndị na-agba akwụna maka ndị nne ha ukwu.[8] na-anaghị akwụ ụgwọ mgbe ọbụla. Ọ chọpụtakwara na a ghọgburu ha na nkwa na ha ga-arụ ọrụ n'Ịtali, nke a kpaliri ya ịkwado nkwa ime ihe gbasara ọnọdụ ọ bụla mgbe ọ nọ n'ọnọdụ nke ike na ikike.

Nkwado

N'afọ 1999, mgbe di ya bụ Atiku Abubakar  ghọrọ Onye na-esote onye isi ala, o jidere ohere a ịmalite ịkwado ndụmọdụ iji kwụsị ịgba akwụna a na-amanye mmanye na ụdị ndị ọzọ nke ịzụ ahịa mmadụ. Akpa, o guzobere Women's Trafficking and Child Labor Labor Eradication Foundation (WOTCLEF), ma kwadoro ụgwọ nke onwe maka ntaramahụhụ siri ike maka ndị na-azụ ahịa a, nakwa maka ntọala ụlọ ọrụ gọọmenti etiti (National Agency for Prohibition of Trafficking in Persons) nke ga-ebu maka agha ahia ndi mmadu no na Naijiria. Ọ malitere ịbịa nabata ụmụ agbọghọ na-eme ka ụmụ agbọghọ si mba dị iche iche gbanwee.[9]

Remove ads

Ihe Nrita

  • 2010 - D'linga Award [10]
  • 2002 - Annual Nigerian Women's Award [11]

Mbipụta

  • Educating the Nigerian Child (2005) [12]  [13]
  • Empower Law to Fight Child Slavery (2001) [14]
  • Let us celebrate humanity: a collected speeches on women's right and human trafficking (200x?) [15]

Leekwa

Ṅrụtụaka

Loading content...
Loading related searches...

Wikiwand - on

Seamless Wikipedia browsing. On steroids.

Remove ads