From Wikipedia, the free encyclopedia
Peng Liyuan ( nke amụrụ na ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Nọvemba na afọ 1962) bụ onye na -agụ egwu ndị China nke oge a ma bụrụ kwa nwunye onye isi ala China na onye isi kachasịna obodo ahụ. Peng Liyuan n'alụ onye ode akwụkwọ ukwu nke otu Kọmunist n'China na Onye isi ala Xi Jinping ugbu a . [1] N'ime afọ 2012 ruo n'afọ 2017, Peng bụ onye isi oche nke Academy nke Art nke ndị mmadụ n'oge ahụ. Site kwa na afọ 2005 ruo n'afọ 2010,ọ jere ozi dị ka osote onye isi otu ndị ntorobịa na China . [2]
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | China |
aha n'asụsụ obodo | 彭麗媛 |
aha enyere | Liyuan |
aha ezinụlọ ya | Peng |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Novemba 1962 |
Ebe ọmụmụ | Yuncheng County |
Dị/nwunye | Xi Jinping |
nwa | Xi Mingze |
Asụsụ obodo | Mandarin |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Chinese |
Ọkwá o ji | First Lady of China |
ebe agụmakwụkwọ | China Conservatory of Music |
Ebe obibi | Beijing |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Chinese Communist Party |
ọkwa agha | major general |
conflict | Sino-Vietnamese conflicts 1979–1991 |
ngalaba agha | People’s Liberation Army |
ụdị olu | soprano |
ngwa egwu | olu egwụ |
ụdị | Chinese folk art |
ihe omume dị ịrịba ama | agbamakwụkwọ, omụmụ nwa |
Peng wuru ewu dị ka onye na -agụ egwu ọnụ ya na ari elu (nke a na akpọ Soprano n'asụsụ bekee) site na ngosi ya mgbe niile na mmeme CCTV New Year's Gala, bụ nke mmemme nyonyo China nke a na -ahụkarị n'oge Afọ Ọhụrụ nke obodo ahụ. [3] Peng emeriela ọtụtụ asọmpi ma nweta nsọpụrụ na ihe nrita n'asọmpi ịbụ abụ na mba niile. [3] Egwu Peng ndị ama ama gụnyere "Ndị obodo anyị" ( 《父老乡亲》 ), "Zhumulangma" ( Ugwu Everest ; 《珠穆朗玛》 ) na "N'ọhịa Olileanya" ( 《在希望的田野上》 ). Peng gụkwara abụ isiokwu nke ọtụtụ ihe usoro ejije a n'eme na onyonyo ndị nke ama ama, dị ka The Water Margin (n'afọ 1998). Ọ sọkwara na -eme ihe nkiri maka ịgụegwu. Na afọ 1986, ọ nwetara nnukwu ihe nrita akpọrọ Plum Blossom Award, nke bụ onyinye nturu ugo kachasị elu nke China, maka ọrụ ejije nke ọ mere onye ka gosipụta ihe na Nwa Nwanyị Nwere Ntutu Ọcha (nke a na akpọ The White haired Girl n'asụsụ bekee). [4]
Peng bụ onye nkịtị nke ndị agha nnwere onwe nke ndị China, ma nwee ọkwa nkịtị nke dị ka Major General tupu ahọpụta ya dị ka onye isi nke Art Academy, nke mere enye ya ọkwa ọfụma. [3] A maara ya n'ime China maka echiche ejiji ya nke na adị iche, nke a na -ekenye onye ọrụ ya na akwara ya akwa a na akpọ Ma Ke. [5] [6] [7] [8]
Na afọ 2014, akwụkwọ akụkọ Forbes depụtara Peng dị ka nwanyị nke iri ise na asaa kachasị nwee ike n'ụwa. [9]
Peng Liyuan bụ onye obodo Yuncheng County,nke dị nampaghara Shandong . Peng sonyeere ndị agha ntọhapụ ndị mmadụ na afọ 1980, mgbe ọ dị afọ iri na asatọ, wee malite dị ka onye agha nkịtị. N'ihi ikike olu ya, Peng mechara mee njem nlegharị anya iji kwalite mmụọ ndị agha n'oge esemokwu oke ala nke Sino-Vietnam . [10] Peng buru ụzọ rụọ ọrụ na mba niile China wee bụrụ onye ama ama n'oge izizi site na mmeme CCTV New Year's Gala na afọ 1982, mgbe osoro na ejije On the Plains of Hope .
Peng na Xi Jinping alụọla dị na nwunye ihe karịrị afọ iri atọ. [3] Ha nwere otu nwa nwanyị aha ya bụ Xi Mingze (习明泽) onye nke amụrụ na afọ 1992, aha ya bụ Xiao Muzi (小木子). [11]
Enwere ike ikwu na akụkụ ka ukwuu nke mmekọrịta ha, Peng enwela ezigbo aha n'ime China, nke gafere nke dị ya bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị. [3] Kemgbe dị ya ghọrọ onye ode akwụkwọ ukwu nke ndị Kọmunist ( ya bụ onye isi otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị) na ọnwa Nọvemba n'afọ 2012, [3] na Onye isi ala China ( de jure head of state ) na ọnwa Machị n'afọ 2013, akwụkwọ akụkọ America n'akpọ ya nwanyị mbụ nke China .
Ndị enyi Xi na Peng bụ ndịmere ka ha mara onwe ha dị ka osi mee ọtụtụ di na nwunye ndị China na oge afọ 1980. Xi bụ onye a ma ama na agụmakwụkwọ n'oge mbido enyi ha, ọ jụkwara ajụjụ maka usoro ịbụ abụ. [3] Xi bụ nwa nwoke onye ama ama na China Xi Zhongxun onye na ekwu si okwu ike na na akwado mgbanwe. Ezinụlọ Peng doro nabatara mmekọrịta ahụ n'ụzọ dị mfe, n'ihi omume ya Xi na ndi be ha nke ama ama. Mgbe ha nwetara nkwenye nne na nna, ha lụrụ di na nwunye na ụbọchị mbụ na ọnwa Septemba n'afọ 1987 na Xiamen, Fujian . Ụbọchị anọ ka e mesịrị nke a, Peng Liyuan laghachiri n'Beijing ka ọ soro ma pụta na mmeme National Art Festival, ozugbo nke a gasiri, ọ gawara United States na Canada ebe ọ soro ma pụta na mmeme. Kemgbe ahụ, Xi na Peng n'ebi ndụ dị iche iche, ebe Peng na anọ nke ukwuu na Beijing, di ya na anọ nke ukwuu na Fujian. Emesịa, ọna anọ n'obodo Zhejiang.
Peng na -etinye aka na ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụkwa onye otu Kọmitii Mba nke iri na otu nke Ọgbakọ Ndụmọdụ Ọchịchị nke Ndị China . Peng bụ onye nnọchite anya ihe ọma nke WHO maka ụkwara nta na HIV/AIDS kemgbe afọ 2011. [12]
Na ụbọchị nke iri abụọ nke ọnwa Nọvemba n'afọ 2014, Mahadum Massey nke dị na obodo New Zealand nyere Peng asambodo Doctorate na nkwanye ugwu maka onyinye mba ofesi ya na nka, ahụike na agụmakwụkwọ. [13] Peng bụrụ abụ ma gba egwu na afọ 2007 nke egosi na nyonyo na China, nke gosipụtara ndị Tibet ebe ha na-ekele ndị agha China maka ịtọhapụ ha. [14]
Ozugbo ngagharị iwe Tiananmen Square nke 1989 mechara na ọwa June n'afọ 1989, Peng Liyuan bụrụ abụ maka ndị agha na edesa iwu. Foto na-egosi ebe ahụ Peng, yi uwe ndị agha na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, na-abụ abụ na ndị agha nwere okpu agha ehe ha nọ na ahịrị na n'ahịrị na Tiananmen Square Beijing, ehichapụ foto nke ahụ ngwa ngwa na ntanetị China tupu ọ nwee ike mepụta mkparịta ụka n'ịntanetị. Agbanyeghị nke a, foto ahụ - nke ọtụtụ mmadụ hụrụ ma kerịta site n'aka ndị na -ekiri ihe nọ na mpụga China tụtere ncheta nke onye ndu zọdara ndị China. Ihe eserese ahụ sitere n'azụ akwụkwọ akụkọ ndị agha dị n'ihu ọha nke mbipụtara n'afọ1989 nke akpọrọ People's Liberation Army Pictorial. [15] [16] [17]
N'ọnwa June n'afọ 2013, akwụkwọ akụkọ mba ofesi nke America bipụtara akụkọ akpọrọ "Gịnị kpatara Michelle Obama ekwesịghị izute Peng Liyuan" nke kwadoro nhọrọ nke First Lady Michelle Obama na ọchoghị izute Peng Liyuan. Ka o sina dị, Michelle Obama mechara zute Peng n'ọtụtụ nlegharị anya nke ekwuru maka ya nke ukwuu na Beijing na Washington, DC [18] [19]
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.