![cover image](https://wikiwandv2-19431.kxcdn.com/_next/image?url=https://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/f/f3/Mr_Nnamdi_Asomugha.jpg/640px-Mr_Nnamdi_Asomugha.jpg&w=640&q=50)
Nnamdi Asomugha
From Wikipedia, the free encyclopedia
Nnamdi Asomugha ( /n ɑː m d i Ɑː s əm w ɑː / NAHM -dee AH -səm-wah ; ụbọchị ọmụmụ ya bụ July 6, 1981) bụ onye na'eme ihe nkiri ka ọrụ ya. Ọ bukwa onye Nigeria na America. Ọ bụbu onye egwuregwu ụdị nke bọọlụ America . Ọ gbara bọọlụ kọleji maka Mahadum California, Berkeley, ebe anọ họrọ ya na agba nke mbụ n'afọ 2003 na NFL Draft 2003 site n'aka Oakland Raiders . Ọ gbakwara ndi Philadelphia Eagles na San Francisco 49ers bọọlụ. Ka'mgbe ọtụtụ afọ, a na-ewere ya dị ka otu n'ime ndi kachasị mma na ịgba ụdị bọọlụ ahụ na NFL . [1] [2] [3] [4] [5] [6] N'ime afọ iri na otu dị ka onye na-agba bọọlụ, a hoputara ya All-Pro ugboro anọ, gụnyere ugboro abụọ ka ndị otu mbụ na bọọlụ. A họrọ Asomugha dị ka onye otu Fox Sports NFL All-Decade Team 2000-2009 [7] na USA Today ' NFL All-Decade Team 2000s, [8] ma a na-ahụta ya dị ka otu n'ime ndị kasị ukwuu na Oakland Raiders oge niile. [9] [10] [11]
![Thumb image](http://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/f/f3/Nnamdi_Asomugha_Eagles_vs_Redskins_10.16.11.jpg/640px-Nnamdi_Asomugha_Eagles_vs_Redskins_10.16.11.jpg)
ụdịekere | nwoke ![]() |
---|---|
mba o sị | Njikota Obodo Amerika ![]() |
obodo maka egwuregwu | Njikota Obodo Amerika ![]() |
Aha enyere | Nnamdi ![]() |
aha ezinụlọ ya | Asomugha ![]() |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 6 Julaị 1981 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Lafayette ![]() |
Dị/nwunye | Kerry Washington ![]() |
Asụsụ obodo | Bekee ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee ![]() |
Asụsụ ọ na-ede | Bekee ![]() |
Ọrụ ọ na-arụ | American football player, omee, onye nhazi ederede, onye na-emeputa ihe nkiiri ![]() |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | cornerback ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | Narbonne High School, University of California, Berkeley, Bishop Montgomery High School, Leuzinger High School ![]() |
Ebe obibi | Los Angeles ![]() |
onye nsonye òtù egwuregwu | Las Vegas Raiders, Philadelphia Eagles, San Francisco 49ers, California Golden Bears football ![]() |
ụdị egwuregwu | American football ![]() |
Onye òtù nke | Kappa Alpha Psi ![]() |
Asomugha nwetara otuto n'kwuputa dị oke egwu maka ihe nkiri ebe ogosipụtara onwe ya di ka Carl King na Crown Heights (2017). [12] [13] [14] Ahoputara ya di'ka inwe onyinye nke Independent Spirit Award for Best Supporting Male ya na NAACP Image Award maka Outstanding Supporting ya bu nkwado onye nwoke kacha buru opuruiche na'ime ihe nkiri na fim. [15] [16] Variety kpọrọ ya aha n’ime ndị asaa na-eme ihe nkiri n’afọ 2017. [17]