![cover image](https://wikiwandv2-19431.kxcdn.com/_next/image?url=https://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/d/da/South_African_Foreign_Minister_Naledi_Pandor_at_the_State_Department_in_Washington%252C_D.C._on_September_26%252C_2023_%2528cropped%2529.jpg/640px-South_African_Foreign_Minister_Naledi_Pandor_at_the_State_Department_in_Washington%252C_D.C._on_September_26%252C_2023_%2528cropped%2529.jpg&w=640&q=50)
Naledi Pandor
From Wikipedia, the free encyclopedia
Grace Naledi Mandisa Pandor (née Matthews; Amụrụ n'ụbọchị 7 Disemba 1953) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị South Africa, onye nkuzi na agụmakwụkwọ na-eje ozi dị ka Minista nke Mmekọrịta na Imekọ ihe ọnụ kemgbe afọ 2019. Ọ na-eje ozi dị ka onye omeiwu (MP) maka African National Congress (ANC) kemgbe afọ 1994.
ụdịekere | nwanyị ![]() |
---|---|
mba o sị | South Africa ![]() |
Aha enyere | Naledi, Grace, Mandisa ![]() |
aha ezinụlọ ya | Pandor ![]() |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 7 Disemba 1953 ![]() |
Ebe ọmụmụ | Durban ![]() |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee ![]() |
Ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ![]() |
onye were ọrụ | University of Cape Town ![]() |
ebe agụmakwụkwọ | University of London, Stellenbosch University, University of Eswatini ![]() |
affiliation string | Minister of International Relations and Cooperation of South Africa ![]() |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | African National Congress ![]() |
okpukpere chi/echiche ụwa | Okpukpere Alakụba ![]() |
so na | World Economic Forum Annual Meeting 2020 ![]() |
Ihe nrite | honorary fellow of the African Academy of Sciences, Order of Jerusalem ![]() |
kọwara na URL | https://www.parliament.gov.za/person-details/4051, https://www.pa.org.za/person/grace-naledi-mandisa-pandor/ ![]() |
![Thumb image](http://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/3/38/Naledi_Pandor_2012.jpg/640px-Naledi_Pandor_2012.jpg)
A mụrụ ya na Durban, Pandor gụsịrị akwụkwọ sekọndrị na Botswana. Ọ ruru eru dị ka onye nkuzi ma kụzie na ọtụtụ ụlọ akwụkwọ na mahadum, ebe ọ nwetara nzere dị iche iche site na mahadum dị iche iche.[1] Pandor malitere ọrụ dị ka onye omeiwu n'afọ 1994.[1] N'oge na-adịghị anya, ọ ghọrọ osote onye isi nke ANC caucus n'afọ 1995.[1] A họpụtara ya ka ọ bụrụ osote onye isi oche nke National Council of Provinces n'afọ 1998 wee bụrụ onye isi oche n'afọ 1999.[1]
O bu ụzọ bụrụ onye otu kansụl mba n'afọ 2004, na-esote mkpebi Onye isi ala Thabo Mbeki ịhọpụta ya dị ka Minista nke Mmụta.[2] Ọ nọgidere n'ọkwa ya na kọmitii nke Kgalema Motlanthe. Onye isi ala a họpụtara ọhụrụ bụ Jacob Zuma họpụtara ya ka ọ bụrụ Minista sayensị na teknụzụ n'afọ 2009.[3] Ọ rụrụ ọrụ n'ọkwa ahụ ruo mgbe a họpụtara ya dị ka Minista na-ahụ maka ihe ndị dị n'ime obodo n'afọ 2012.[4] Ọ laghachiri n'ọkwa Minista nke Sayensị na Teknụzụ n'afọ 2014 wee nwee ya ruo afọ 2018, mgbe ọ ghọrọ Minista nke agụmakwụkwọ na ọzụzụ dị elu na kọmitii mbụ nke Onye isi ala Cyril Ramaphosa.[5][6] Mgbe ntuli aka nke afọ 2019 gasịrị, a kpọtụrụ Pandor aha dị ka onye nwere ike ịzọ ọkwa osote onye isi ala nke South Africa.[7] Kama nke ahụ, a họpụtara ya ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba ụwa na imekọ ihe ọnụ.[8]
A mụrụ Grace Naledi Mandisa Matthews n'ụbọchị 7 Disemba 1953 na Durban, Natal, na Regina Thelma (nwụrụ n'afọ 2002) na Joe Matthews (1929), onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye na-emegide ịkpa ókè agbụrụ na nwa nke agụmakwụkwọ Z. K. Matthews (1901 1910-1968).[9][10] Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị na sekọndrị na Botswana. Ọ gụrụ akwụkwọ na Gaborone Secondary School. N'agbata afọ 1973 ruo afọ 1977, ọ nwetara asambodo maka agụmakwụkwọ na-aga n'ihu na nzere bachelọ na Mahadum Swaziland na Mahadim Botswana, n'otu n'otu.[1] Ọ gara n'ihu na-aga mba ofesi ma nweta diplọma na agụmakwụkwọ na nzere MA na Mahadum London n'etiti afọ 1978 ruo afọ 1979.[1][11]
Pandor nwetara diplọma na agụmakwụkwọ ka elu, nchịkwa na idu ndú site na Bryn Mawr Summer Programme n'afọ 1992, n'oge na-adịghị anya, ọ debanyere aha na Harvard Kennedy School iji nweta diplọma na idu ndọkwa na mmepe n'afọ 1997. O nwetakwara nzere MA na asụsụ na Mahadum Stellenbosch n'otu afọ ahụ.[1] Pandor nwetara Ph.D. ya na agụmakwụkwọ na Mahadum Pretoria n'afọ 1019, na thesis akpọrọ "Ihe a na-asọ mpi nke mgbanwe na agụmakmakwụkwọ ka elu na South Africa mgbe ịkpa ókè agbụrụ gasịrị".[11][12][13]