Onye French na-ese ihe From Wikipedia, the free encyclopedia
Kader Attia (amụrụ na ọnwa 30 Disemba n'afọ 1970) bụ onye obodo Algeria-French n'ese ihe. [1][2][note 1]
A mụrụ Attia na obodo Dugny, France na nne na nna Algeria ma zụlite ya na Paris n'obodo Algeria . [3][4] Ọ gụrụ akwụkwọ na l'école Duperré de Paris, l'école des arts appliqués La Massana de Barcelone ma gụsịrị akwụkwọ na Ecole nationale superieure des arts décoratifs Paris, na 1998.[5][6][7]
Ọrụ Attia na-enyocha ikpe na-ezighị ezi nke ọha na eze, obodo ndị a na-akparaghị ókè na postcolonialism. [8] [9][10]
N'afọ 2016, Attia guzobere La Colonie, ụlọ ngosi ihe dị nso na ọdụ ụgbọ okporo ígwè Paris 'Gare du Nord.[11][12][13] Na ọnwa Machị, n'afọ 2020, La Colonie mechiri kpamkpam n'ihi ọrịa coronavirus.[14] Na ọnwa Machị n'afọ 2021, a mara ọkwa Attia dị ka onye nlekọta maka 12th Berlin Biennale. [15] Ọ bụ onye n'ese ihe mbụ n'elekọta biennale kemgbe New-York dabeere na DIS, bụ ndị gosipụtara mbipụta nke 9 na 2016. [4] N'ọnwa Nọvemba n'afọ 2021, o nwere ihe ngosi akpọrọ "On Silence" na Mathaf: Arab Museum of Modern Art na Doha. [16]
A n'etinye ọrụ Attia na nchịkọta n'adịgide adịgide nke:
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.