![cover image](https://wikiwandv2-19431.kxcdn.com/_next/image?url=https://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/4/47/Factory_in_China.jpg/640px-Factory_in_China.jpg&w=640&q=50)
Industry of China
From Wikipedia, the free encyclopedia
Ụlọ Mmepụta bụ pacentị iri atọ na itoolu na ụma itoolu nke nnukwu ihe nrụpụta China ( GDP ) n'afọ 2017. [1] N'afọ 2007, ụlọ ọrụ nrụpụta (gụnyere igwupụta ihe n'ala, imepụta ihe, iwu ihe, na ike ) nyere pasentị iri anọ na isii na ụma asaa nke GDP n'afo 2010 wee were pasent iri abụọ na asaa nke ndị ọrụ. N'afọ 2015, ngalaba ụlọ ọrụ mmepụta ihe nyere aka na pacent iri anọ na anọ nke GDP China. Ngalaba na-emepụta ihe mepụtara pasent iri ano na anọ na otu nke GDP na 2004 wee bụrụ pasent iri na otu na otu uma nke ọrụ niile n'afọ 2006.
Akụkụ nke | industrial sector, economy of the People's Republic of China ![]() |
---|---|
mba/obodo | China ![]() |
![Thumb image](http://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/4/47/Factory_in_China.jpg/640px-Factory_in_China.jpg)
China bụ obodo kacha emepụta fatịlaịza kemịkalụ, Cịmentị na igwe steel n'ụwa. Tupu afọ 1978, ụlọ ọrụ gọọmentị steeti ka mepụta ihe. N'ihi mmezigharị akụ na ụba nke sochiri, mmụba dị ukwuu na mmepụta site na nkwado ụlọ ọrụ ndị gọọmentị ime obodo, ọkachasị obodo na ime obodo, na, na -arịwanye elu, site na ndị ọchụnta ego onwe ha na ndị na-etinye ego si mba ọzọ, mana ka ọ na-eru afọ 1990, ngalaba steeti mere ihe ruru ihe dị ka pasent iri asaa. Ka ọ na-eru afọ 2002, oke nke nrụpụta ụlọ ọrụ sitere n'aka ụlọ ọrụ gọọmentị na nke gọọmentị steeti jigidere belatara site n'ụlọ ọrụ gọọmentị na-ahụ maka onwe ha inweta pasent iri anọ na isii nke mmepụta ụlọ ọrụ China. N'ọnwa Nọvemba afọ 2012, Kansụl Steeti nke ndị Mba nke China nyere iwu "ntule ihe egwu mmekọrịta mmadụ na ibe ya" maka nnukwu ọrụ nke ụlọ ọrụ nrụpụta niile. Ihe a chọrọ butere ngagharị iwe ọha na ebe ụfọdụ maka atụmatụ nke ọrụ ma ọ bụ mgbasaa. [2]