Ọkaiwu Nwanyị Naijeria From Wikipedia, the free encyclopedia
Hauwa Ibrahim (a mụrụ n'afọ 1968) bụ nwaafọ Naijiria bụọkàiwu maka oke mmadụ,onye nke ritere European Parliament's Sakharov Prize n'afọ 2005.
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Hauwa |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Jenụwarị 1968 |
Ebe ọmụmụ | Gombe |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọka iwu |
ụdị ọrụ ya | onye ọka iwu |
onye were ọrụ | Saint Louis University |
okpukpere chi/echiche ụwa | Okpukpere Alakụba |
Ihe nrite | Sakharov Prize, Knight of the Order of Merit of the Italian Republic, honorary citizen of Paris, Margaret Brent Award |
A mụrụ Ibrahim na Gombe n'afọ 1968. Ọ gara ọzụzụ ị bụ onye ọka iwu ma e were ya dị ka nwanyị Alakụba mbụ na Naijiria iji nweta ọdịiche a. [1]
Ibrahim ama maka ọrụ ịgbachitere ndị mmadụ na-anaghị ego ikpe n'okpuru iwuSharịya nke islam ndị dị ire ná mpaghara ugwu nke Naijiria. Ọ gbachitere Amina Lawal, [2] Safiya Hussaini na Hafsatu Abubákar . N’afọ 2005 e nyere ya Sakharov Prize maka ọrụ a. [3]
Hauwa a bụrụla Prọfesọ na-eleta Mahadum Saint Louis University of Law na Stonehill College, World Fellow na Mahadum Yale, Radcliffe fellow, ya na onye otu na Human Rights Programme na Islamic Legal Studies Program na Mahadum Harvard. Hauwa bụzi onye nkuzi na onye nyocha na Mahadum Harvard. [4] Ọ bụkwa otu n'ime ndị isi iri abụọ na ise na Information and Democracy Commission nke ndị Reporters Without Borders malitere . [5]
Mgbe ọ bụ Radcliffe fellow, Ibrahim bidoro usoro ị dọ aka na ntị iji banye na usoro ntọala e dere ede nke iwu Sharịya ma nyochaa etu ha siri metụta ọrụ ọkaiwu, nke, n'aka nke ya, metụtakwara ikike ụmụ mmadụ nke ụmụ nwanyị na West Afrịka. Nchọpụta ya mepụtara akwụkwọ Practicing Shariah Law: Seven Strategies for Achieving Justice in Shariah Courts, nke e bipụtara n'ọnwa Jenụwarị afọ 2013. " [6]
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.