Egwu Omenala ndị Igbo. Ndị na-agba ya bụ ndị nne maọbu ụmụ nwanyị mụrụ nwa ọhụụ nke ga-enywre ha aka imegharị ahụ ha, kụchalata ibu na abụba nwa From Wikipedia, the free encyclopedia
Egwu Agbachaekurunwa[1] bụ ihe eji mara ndi Ụmụcho Ụmụediabali Ihitteaforukwu Ahiazu Mbaise n'Imo steeti. A na-agba ya oge ekeresimasi, ọ bụrụ na mmadụ nwụọ, ikufute nwa, ihe nrisa, na ihe ndi ọzọ dị iche iche. Nwanyị ọbụlà mụrụ nwa n’ụlọ ọgwụ, a na-eburu egwu a ga n’ ụlọ ọgwụ, gaa kuru ya na nwa kutere di ya. Nwanyị na-alụ dị, tolue ịlụ dị, e ji egwu akpọla ya na di
mba/obodo | Naijiria |
---|---|
onye na-eme ihe nkiri | nwanyị |
nchekwa ngwa égwu | ịgba, Ekwe, Opi |
ndị ji ya eme ihe | Ndị Igbo, Ahiazu Mbaise |
Mana ana-agbakarịcha ya n' ọnwa Nọvemba rue Disemba n' oge afọ ọhuru. ụmụanyị ndị na anọghi n’obodo na-ekwo egwu a kworo otu ọ dị ụtọ n’egwu ọdịnaala abata n’obodo[2].
A na eji egwu a enye umunwanyi nọ na dị na-eme isi ike ọzụzụ, site na-iri ha nha. Isi ike a bụ ihe ndi di ka izuo ohi, ịkwaa iko, ịtụ asi na imegbu mmadụ. iwu ndị na ejikọlata nwanyị n' obodo. Ya cheta na aga eri ya iwu, ojikọlata onwe ya.
Na igba egwu a, a na eyi uwe elu ụmụnwanyị, na ichafu isi.
Ngwa egwu eji akụ ya bụ isi ogwe, udu, ọyọ, ogele na ọkwá.
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.