From Wikipedia, the free encyclopedia
Sir Donald Burns Sangster ON GCVO (Ọktoba 26 1911 – 11 Eprel 1967) bụ onye ọkaiwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Jamaica, na onye isi ala Jamaic nke abụọ. [1]
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Jamaikạ |
aha enyere | Donald |
aha ezinụlọ ya | Sangster |
ụbọchị ọmụmụ ya | 26 Ọktoba 1911 |
Ebe ọmụmụ | Saint Elizabeth Parish |
Ụbọchị ọnwụ ya | 11 Eprel 1967 |
Ebe ọ nwụrụ | Montréal |
Ebe olili | National Heroes Park |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | Member of the House of Representatives of Jamaica, Prime Minister of Jamaica, Minister of Finance and the Public Service |
ebe agụmakwụkwọ | Munro College |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Jamaica Labour Party |
Ihe nrite | Order of the Nation |
A mụrụ Donald Burns Sangster na Black River na parish nke St. Elizabeth, Jamaica. Nna ya William B. Sangster bụ onye nyocha ala na onye ọrụ ugbo. Aha nne ya bụ Cassandra Sangster (née Plummer). [2]S gara ụlọ akwụkwọ a ma ama nke dị na St. Elizabeth . [1]
Ọ banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mgbe ọ dị afọ iri abụọ na otu na 1933, mgbe a họpụtara ya na Parish Council nke St Elizabeth, Jamaica. N'afọ 1944, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye nnọchi anya Jamaica dị ka onye otu Jamaica Labour Party (JLP). Ọ gara n'ihu bụrụ Minista na-ahụ maka ọdịmma ọha na eze na ọrụ ma mesịa bụrụ Minista nke ego. [3] họpụtara ya dị ka osote praịm minista na 11 Machị 1963. Ọ ghọrọ onye na-anọchite anya praịm minista na Febụwarị 1964 mgbe praịm dinista Sir Alexander Bustamante dara ọrịa.
[4]'Na 21 Febrụwarị, na ntuli aka izugbe Jamaica 1967, ndị JLP meriri ọzọ, merie 33 n'ime oche 53, ebe PNP were oche iri abụọ.
[5] Ọ nọchiri Bustamante dị ka Prime Minister na 23 February 1967, na ọ nwere naanị otu nzukọ ọgbakọ tupu ọ rịa ọrịa n'ihe na-erughị izu abụọ wee bụrụ naanị praịm minista nwụrụ n'ọfịs na 11 Eprel, mgbe ọ nwesịrị ọbara ọgbụgba subarachnoid.
Ihu ya pụtara n'akwụkwọ ndekọ ego puku dollar ise nke Jamaica. Akpọrọ aha ọdụ ụgbọ elu Sangster International Airport dị na Montego Bay aha ya.
Sangster dara ọrịa [6] 18 Machị 1967, gọọmentị US kpọgakwara ya na Montreal Neurological Institute maka ọgwụgwọ ọkachamara. [7] dara n'ọnọdụ coma izu ole na ole ka e mesịrị na 1 Eprel, Queen Elizabeth nke Abụọ mekwara ya knight n'oge ahụ; ọ nwụrụ ụbọchị 10 ka e mesịrị.
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.