Araqi (ihe ọṅụṅụ)
From Wikipedia, the free encyclopedia
Araqi (Arabic, : ; nakwa araki, aragy) bụ mmanya na-aba n'anya nke a na-aṅụ na Obodo Sudan.[1] Ntinye nke Sharia na afo 1983 na Obodo Sudan gbochiri ire mmanya na-aba n'anya, mana ahịa ojii dị iji gboo mkpa obodo. A na-eme ihe ọṅụṅụ ahụ site na ịgwokọta dates na mmiri ya na yist, na-agbanye ngwakọta ahụ, wee mee ka ọ dị ọkụ. A na-aṅụkarị ya n’agbakwunyere ihe obula.[2]
Type | Distilled alcoholic spirit |
---|---|
Country of origin | Sudan |
Region of origin | Sudan and South Sudan |
Introduced | Medieval |
Alcohol by volume | Variable, 30–80% |
Proof (US) | 60–160° |
Color | clear |
Ingredients | dates, water, yeast |
N'oge agha na Darfur, ọtụtụ ụmụ nwanyị ndịda Sudan bịara n'ebe ugwu dịka ndị gbara ọsọ ndụ, wee chọpụta na ụfọdụ n'ime naanị ọrụ ha nwere bụ ịgba akwụna maọbụ ịmeputa araqi, nke ikpeazụ bụ nkà ụfọdụ nwere, na ihe a pụrụ ịdabere na ya. Akụkọ UN nke afọ 2000 kwuru na 80 pacenti nke ụmụ nwanyị nọ n'ụlọ mkpọrọ ụmụ nwanyị nke Khartoum nọ ebe ahụ n'ebubo ịgba akwụna maọbụ ịmeputa araqi.[3]
Araqi bụkwa mmanya a ma ama na South Sudan, nke kewara na Sudan na afo 2011 na ebe mmanya na-aba n'anya bụ iwu.[4]
Nchịkọta mmiri n'ụlọ nwere ike ibute nsị methanol; mmadụ iri nwụrụ na ọtụtụ ndị ọzọ kpuru ìsì site n'aka araqi emeputa n'ụzọ na-ezighị ezi na East Darfur na afo 2017.[5]
N'afọ 2020, iwu ọhụrụ nyere ikike ire mmanya na-aba n'anya nye ndị na-abụghị ndị Alakụba na Obodo Sudan.[6]