![cover image](https://wikiwandv2-19431.kxcdn.com/_next/image?url=https://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/d/d6/Adebayo_Adedeji_%25281986%2529.jpg/640px-Adebayo_Adedeji_%25281986%2529.jpg&w=640&q=50)
Adebayo Adedeji
Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị(1930-2018) / From Wikipedia, the free encyclopedia
Adebayo Adedeji (21 Disemba 1930 na 25 Eprel 2018) bụ onye Naijiria na-ahụ maka akụ na ụba na agụmakwụkwọ. Onye prọfesọ zuru oke mgbe ọ dị afọ iri atọ na isii, ọ bụ Federal Kommishiona nne Economic Development & Reconstruction nke Naịjirịa site na 1971 ruo 1975.[1] Ọ bụ ya na-ahụ maka mmepe akụ na ụba na iwughachi nke Naịjirịa mgbe agha obodo gasịrị. Na June 1975, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi odeakwụkwọ nke United Nations Economic Commission for Afrika ma nọgide n'ọkwa a ruo July 1991. Adedeji dere Lagos Plan of Action nke 1980 nke UN na OAU nabatara.[2] Mgbe ọ laghachiri Naịjirịa, o guzobere Afrikan Centre for Development and Strategic Studies (ACDESS), ụlọ ọrụ na-abụghị nke gọọmentị na-enweghị uru, ụlọ ọrụ na'iche echiche nke raara onwe ya nye ọtụtụ ọzụzụ na ọmụmụ atụmatụ na maka Africa. Ọ natara nsọpụrụ mba nke Commander of the Federal Republic.
N'ọnwa Disemba afọ 2010, mgbe ọ gbara afọ iri asatọ, ọ lara ezumike nká na ndụ ọha na eze ma nọrọ afọ ndị ikpeazụ nke ndụ ya n'ụzọ dị jụụ n'obodo ya bụ Ijebu-Ode, Ogun Steeti, Naijiria.