Akara Ngosi ikuku
nha nke mmetọ / From Wikipedia, the free encyclopedia
Ụlọ ọrụ gọọmentị na-eji akara ngosi ikuku nke a na akpobere di ka (AQI) eme ihe iji gwa ọha na eze etu ikuku si emetọ ugbu a ma ọ bụ etu a na-atụ anya na ọ ga-abụ.[1][2][3] A na-enweta ozi AQI site na ịhazi nkezi ọgụgụ site na ihe mmetụta ikuku, nke nwere ike ịbawanye n'ihi okporo ụzọ ụgbọ ala, ọkụ ọhịa, ma ọ bụ ihe ọ bụla nwere ike ịkawanye mmetọ ikuku. Ihe mmetọ ndị a nwalere gụnyere ndịa na bekee; particulates, ozone, nitrogen dioxide, carbon monoxide, sulphur dioxide, n'etiti ndị ọzọ.
Ihe ize ndụ ahụike ọha na eze na-abawanye ka AQI na-arị elu, karịsịa na-emetụta ụmụaka, ndị agadi, na ndị nwere nsogbu iku ume ma ọ bụ nke obi. N'oge ndị a, ụlọ ọrụ gọọmentị na-agba ndị mmadụ ume belata mmega ahụ n'èzí, ma ọ bụ ọbụna zere ịpụ kpamkpam. A pụkwara ịtụ aro iji ihe nkpuchi ihu dị ka ihe nkpuchi ákwà.
Mba dị iche nwere akara ngosi nke ikuku nke ha, nke kwekọrọ na ụkpụrụ dị iche iche nke ikuku. Ụfọdụ n'ime ndị a nke a na akpọ ndịa na bekee ; Air Quality Health Index nke Canada, Malaysia's Air Pollution Index, na Singapore's Pollutant Standards Index.