Prime Minister nke Togo (2020-ugbu a) From Wikipedia, the free encyclopedia
Victoire Sidémého Dzidudu Dogbé Tomegah (amụrụ na ọnwa 23 Disemba na afọ 1959) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba Togolese onye jere ozi dị ka praịm minista nke mba Togo kemgbe ọnwa 28 Septemba na afọ 2020. Ọ bụ nwanyị mbụ nwere ọfịs ahụ.
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Togo |
Aha enyere | Victoire |
ụbọchị ọmụmụ ya | 23 Disemba 1959 |
Ebe ọmụmụ | Badougbe |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | French language |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | Prime Minister of Togo |
ebe agụmakwụkwọ | University of Lomé, Aarhus University, International Institute for Management Development |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Union for the Republic |
Tupu ọ bụrụ onye isi gọọmentị, Tomegah Dogbé bụbu Minista nke Grassroots Development, Handicrafts, Youth and Youth Employment na Gọọmentị Komi Sélom Klassou na onye isi oche nke Onye isi ala Faure Essozimna Gnassingbé.[1][2]
N'afọ 2008, mgbe ọ nọ n'ọfịs United Nations Development Programme na Benin, Onye isi ala nke mba ahụ Faure Essozimna Gnassingbé na Praịm Minista Gilbert Houngbo gwara Dogbé Tomégah ka ọ jikwaa ọfịs onye nnọchi anya Minista na Praịma Minista na-ahụ maka mmepe na ntọala nke e mepụtara na mba Togo.[3]
N'afọ 2010, mgbe a họpụtara onye isi ala Faure Gnassingbé ọzọ, a họpụtara Tomegah Dogbé ka ọ bụrụ Minista na-ahụ maka mmepe, ọrụ ndị ntorobịa na ọrụ ndị ntụrụndụ na nke abụọ nke Gilbert Houngbo. Ọ nọgidere na-arụ ọrụ minista ya na gọọmentị nke mbụ nke Kwesi Ahoomey-Zunu site na afọ 2012 ruo an afọ 2013 na gọọmentụ nke abụọ nke Ahoomey na-Zunu sitere na afọ 2013 ruo na afọ 2015. Mgbe ntuli aka onye isi ala nke Eprel 2015, Komi Sélom Klassou nọchiri Ahoomey-Zunu dị ka praịm minista na ọnwa 5 June nke afọ 2015. Klaassou guzobere ụlọ ọrụ ya na 28 June 2015 nke Tomegah Dogbé ka nọgidere na-enwe Ministry of Development at the Base, crafts, youth and youth employee.[4]
Onye isi ala Faure Gnassingbe họpụtara Tobegah Dogbe dịka praịm minista na ọnwa 28 Septemba nke afọ 2020 mgbe Komi Selom Klassou gbara arụkwaghịm.[5]
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.