nwanyị mbụ onye isi oche nke Johannesburg Stock Exchange, South Africa From Wikipedia, the free encyclopedia
Nicky Newton-King (amụrụ 1966) bụ onye ọka iwu na-ahụ maka ego na nchekwa yana nwanyị mbụ onye isi nchịkwa nke ụlọọrụ Johannesburg Stock Exchange nọgoro afọ otu narị na iri abụọ na ise. (JSE).
Ụdịekere | nwanyị |
---|---|
Mba o sị | South Africa |
Aha enyere | Nicky |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 1966 |
Asụsụ obodo | Afrikaans |
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
Ọrụ ọ na-arụ | onye ọchụnta ego |
Ebe agụmakwụkwọ | Stellenbosch University, Queens' College |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Newton-King gara Mahadum Stellenbosch ebe ọ gụchara ma nweta BA na LLB . Ọ nwetara LLM ( nke mbụ klaasị ) ọkachamara na ego ụlọ ọrụ, ụkpụrụ nchekwa na iwu nhazi na Mahadum Cambridge, England na 1994. Mgbe ọ nọ na Cambridge, College Queens's College nyere ya akwụkwọ mmụta ntọala maka mmezu agụmakwụkwọ. .
N'ime oge ya na Webber Wentzel Bowens Attorneys ọ dụrụ ụlọ ọrụ ọdụ n'ime ụlọ ọrụ nchekwa na ọrụ ego.
Newton-King sonyeere JSE na 1996 wee bụrụ onye isi nchịkwa nke JSE na 2000. A họpụtara ya na bọọdụ JSE na 2005 o wee bụrụ CEO nke JSE na Jenụwarị 2012, wee nọchie Russell Loubser . Dị ka onye osote onye isi oche, ọ tinyere aka na iwebata atumatu mmemme na-akwado ọrụ na atụmatụ nha anya ọrụ na JSE. Ọ bụkwa ya na-ahụ maka azụmahịa ha na-ere data na atụmatụ eCommerce.
Na 28 October 2014 ọ ghọrọ Director nke World Federation of Exchanges . Ọ na-eje ozi dị ka onye otu nke Financial Markets Advisory Board na Presidential Remuneration Commission. Ọ na-eje ozi dị ka onye so na King Task Group n'ime insider trading na Financial Markets Advisory Board, ma nyere aka dee Insider Trading Act, 1998. Iwu a na-enye nkwụghachi ụgwọ maka mfu ndị e nwetara n'ihi ịzụ ahịa na nzuzo. Kemgbe 2018 ọ bụbu onye nchịkwa na-abụghị onye isi nke Strate (Pty) Ltd.
Na 30 Julaị 2019, Onye isi oche JSE Nonkululeko Nyembezi-Heita kwupụtara na Newton-King ga-agba arụkwaghịm na 1 October 2019. Leila Fourie, onye isi ụlọ ọrụ Commonwealth Bank of Australia nọchiri ya dị ka onye isi JSE. Newton-King kwadoro na ọ lara ezumike nká na JSE n'ụbọchị ikpeazụ nke Gartner Symposium SA na 2 October 2019.
Àtụ:S-start Àtụ:S-bus Àtụ:S-bef Àtụ:S-ttl Àtụ:S-aft Àtụ:S-end
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.