From Wikipedia, the free encyclopedia
Ana Botella Serrano (amụrụ na abalị iri abụọ na atọ n'ọnwa Julaị afọ 1953) bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba Spain onye jere ozi dị ka onye isi obodo Madrid site na 2011 ruo 2015.ọ bụkwa nwunye nke Praịm Minista mgbe di ya José María Aznar . Ọ bụ nwanyị mbụ bụ onye isi obodo Madrid.
A mụrụ Botella na Madrid na abalị iri abụọ na atọ n'ọnwa Julaị n'afọ 1953.[1] Ọ gụrụ akwụkwọ ọtaakara na Colegio Irlandesas Madrid, na njikọ Congregation of Jesus.[2] Ọ gụrụ akwụkwọ gbasara iwu na Mahadum Complutense nke Madrid . Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ gafere ule ọha na eze ịbụ Corps of Civil Administrators nke steeti ahụ.[3]
Botella joined the People's Alliance in 1978.[4] She served for 14 years as civil servant in the Ministry of the Interior, the Civil Governance of Logroño, the Ministry of Public Works, the Ministry of Finance, and the Ministry of Finance in Valladolid.[5]
Botella jere ozi na Madrid City Council site n'afọ 2003 ruo 2011. N'oge ọ nọ n'ọkwa, ọ rụrụ ọrụ dị ka osote onye isi obodo nke Alberto Ruiz-Gallardón nọ n'isi, ma lekọta Ngalaba Ọrụ Ọha (2003-2007) na Gburugburu Ebe Obibi (2007-2011). A katọrọ ya maka ọdịda ya iji gbochie mmetọ ikuku nke Madrid nke na-agafekarị ógó a kwadoro mgbe ọ na-ahụ maka gburugburu obodo ahụ.[6] Botella bụ Onye na-agọnahụ mgbanwe ihu igwe.[7]
N'ọnwa Septemba afọ 2013, Botella dọtara uche ọha na mba ahụ n'ihi nkwupụta na-eme ihere na-enweghịkwa isi o mere n'asụsụ Bekee mebiri emebi (a na-akpọ pijin nglish) n'oge Madrid na-agba mbọ ịnabata egwuregwu 2020 Summer Olympics, nke mebiri ya bụ a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu ma mee ka ọ bụrụ ihe egwuregwu a ma ama.[8]
Mgbe Ruiz-Gallardón gbara arụkwaghịm ka ọ bụrụ Minista Ikpe Ziri Ezi na gọọmentị Praịm Minista Mariano Rajoy, Botella ghọrọ onye isi obodo na 27 Disemba 2011. Na 9 Septemba 2014, Botella kwupụtara na ọ gaghị adọ ndọrọ ndọrọ maka nhọpụta ọzọ na ntuli aka Mee 2015. [9]
Botella lụrụ onye ga-abụ praịm minista Spain n'ọdinihu bụ José María Aznar n'afọ 1977.[10] Di na nwunye ahụ nwere ụmụ atọ: José María, Ana, na Alonso. Nwa ha nwanyị lụrụ onye ọchụnta ego Alejandro Agag na ebe eze nke El Escorial na 5 Septemba 2002. [11] Ana Botella nwere ụmụ ụmụ anọ site na nwa ya nwanyị. [citation needed]
Nhọrọ | Ndepụta | Mpaghara | Ọnọdụ ndepụta | Nsonaazụ |
---|---|---|---|---|
Ntuli aka ime obodo nke Madrid, 2003 | PP | - | Nke atọ (n'ime 55) [12] | Ndị a họpụtara |
Ntuli aka ime obodo nke Madrid, 2007 | PP | - | Nke abụọ (n'ime 57) [13] | Ndị a họpụtara |
Ntuli aka ime obodo nke Madrid, 2011 | PP | - | Nke abụọ (n'ime 57) [14] | Ndị a họpụtara |
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.