Ngwa egwu ọdịnala ndị Igbo From Wikipedia, the free encyclopedia
Ọjà bụ ngwa egwu si n'ọwụwa anyanwụ Naijiria nke a na-ejikarị ngwa ndị Naijiria ndị ọzọ dị ka ekwe, udu, igba, okwa na ichaka/osha eji agu egwu. Ngwá egwú a pụrụ iche ‘na-ekwu okwu’ ka ndị na-akụ egwu na ndị na-agba egwú, na-agba egwu. N'oge a na-agba egwu mmawu na ọwụwa anyanwụ Naijiria, onye ọfụfụ oja na-edu egwu na abụ otuto.[1][2] [3] Onye isi ofufu ọjà na-enwe ike iwepụta ọtụtụ ụda dị ka okwu ọnụ. Ọ bụrụ na onye dị mkpa abanye n'ime oghere igba egwu, onye n'afu ọjà nwere ike iji ngwá egwu a kpọsaa aha onye ahụ. [2]
Ọjà bụ ngwa egwu agụnyere na ngwa egwu ikuku. E nwere ihe abụọ a na-eji arụ ya, nke mbụ bụ osisi, nke na-abụkarị osisi dị nro ma na-egbuke egbuke; nke abụọ bu nke e ji achara mee. N'ime ụdị ihe abụọ a e ji arụ ya, nke osisi na-aka nọtee aka ruo ogologo oge. Ọjà dị ezigbo mkpa, nwekwa ike na ọrụ dị omimi ọ na-arụ na omenala nakwa ndụ ndị Igbo. Ihe e ji mara ọjà bụ ụdị ụda dị elu dị iche iche ọ na-emepụta, na-agbanyeghị na ọ bụ ngwá egwu dị ntakịrị. Ọjà kachasị ukwuu onye odeakwụkwọ bụ Paul Basu chọpụtara dị ihe dịka 26cm n'ogologo, ma nke kacha nta dị 14cm n'ogologo. Ogo ọjà ọbụla na-ekpebi ịdị elu nke ụda ya nakwa ịdị mma ya na ọrụ dịka ngwá egwu. [2]
Ndepụta ndị a dị n'okpụrụ n'akọwa ụdị ọjà di iche iche na ala Igbo
Seamless Wikipedia browsing. On steroids.
Every time you click a link to Wikipedia, Wiktionary or Wikiquote in your browser's search results, it will show the modern Wikiwand interface.
Wikiwand extension is a five stars, simple, with minimum permission required to keep your browsing private, safe and transparent.