Ọdịdị ala nke São Tomé na Príncipe
From Wikipedia, the free encyclopedia
São Tomé na Príncipe bụ obere agwaetiti nke nwere agwa mmiri dị na Gulf of Guinea nke Atlantic Ocean. Isi agwaetiti nke mba ahụ bụ São Tomé Island na Príncipe Island, nke a na-akpọ mba a. Ndị a dị ihe dị ka kilomita narị ato na narị abụọ na iri ise(otu narị na iri itoolu na otu narị na iri isii mi), n'otu n"otu, nʼụsọ oké osimiri Gabon na Etiti Afrịka Ntọala nke mba ahụ bụ latitude nke 1°00′N na longitude ya bụ 7°00.
São Tomé na Príncipe bụ otu n'ime mba kachasị nta n'Afrika nke nwere narị abụọ na itoolu (otu narị na iri atọ mi) nke ụsọ oké osimiri. Ha abụọ bụ akụkụ nke ugwu mgbawa na-adịghịzi adị, nke gụnyekwara agwaetiti Bioko na Equatorial Guinea n'ebe ugwu ọwụwa anyanwụ na Ugwu Cameroon n'ụsọ oké osimiri n'ebe ndịda ọwụwa mmiri. São Tomé dị kilomita iri ise (iri atọ) n'ogologo na (iri abụọ mi) n"obosara na ugwu ugwu nke agwaetiti abụọ ahụ. Ugwu ya ruru 2,024 m (6,640 ) - Pico de São Tomé. Principe dị ihe dị ka kilomita iri atọ (iri na itoolu) n'ogologo na ịse (anọ mi) n"obosara, na-eme ka ọ bụrụ nke pere mpe n'ime abụọ ahụ. Ugwu ya ruru narị itoolu iri anọ na asatọ m (3,110 ) - Pico de Príncipe. Nke a na-eme ka ngụkọta ala nke mba ahụ bụrụ 1,001 km2 ( ), ihe dị ka okpukpu ise nke Washington, D.C. Mmiri na-asọba n'ugwu na-agbadata n'ugwu site na oké ọhịa na ala ihe ọkụkụ ruo n'oké osimiri. Agwaetiti abụọ ahụ dị n'ebe dị otú narị na iri ise km2 ( ). Equator dị n'ebe ndịda nke São Tomé Island, na-agafe obere agwaetiti Ilhéu das Rolas.
Pico Cão Grande (Great Dog Peak) bụ ihe ịrịba ama nke ugwu mgbawa, nke dị na / 0.11667°N 6.56667°E / 0.11.667; 6.56667 na ndịda São Tomé. Ọ na-ebili n'ụzọ dị ịrịba aa karịa narị atọ m (1,000 ft) n'elu ala gbara ya gburugburu na elu ugwu ahụ bụ narị isii na iri isii na atọ m (2,175 ) n"elu oke osimiri.