Ịma Ịgụ Akwụkwọ Nke Ndị Na-amalite amalite
From Wikipedia, the free encyclopedia
Ịma agụ na ide nke ndị na-amalite amalite bụ okwu a na-eji akọwa ihe ọmụma nwatakịrị nwere banyere ịgụ na ide tupu ha amụta otú e si agụ na ide okwu. [1]Ọ na-egosi nkwenye na, n'ebe enwere ndị gụrụ akwụkwọ, ụmụaka - ọbụna ndị nọ otu afọ na afọ abụọ - na-aga ịghọ ndị nwere mmụta. [2]Site na nkwado nke ndị nne na nna, ndị na-elekọta, na ndị nkụzi, nwatakịrị nwere ike ime nke ọma site n'ịpụ na ndị ọgụgụ na-apụta apụta bàa na ndị mụtarala agụmakwụkwọ.[3]
Ihe ndị bụ isi nke ịgụ na ide nke ndị na-apụta apụta gụnyere:
- Ihe na-akpali ibipụta akwụkwọ: Ịnwe mmasị n'ịgụ nakwa ịnụ ụtọ akwụkwọ.
- Vokabụarị: Ịmara aha ihe.
- Mmetụta mbipụta Ịmata mbipụta, ịmara otu esi ejikwa akwụkwọ, na ịmara otu isi soro okwu na íbé
- Amamihe ịkọ akụkọ: Ịbụ onye nwere ike ịkọwa ihe na ihe ndị emere eme nakwa ịkọ akụkọ.
- Imara mkpụrụ edemede gasị: Ịghọta na mkpụrụ edemede dị iche òtù na ibe ha, ịmara aha na ụda ha, na ịmata mkpụrụ edemede n'ebe niile.
- Ịmara maka ụda: Ịbụ onye nwere ike ịnụ ma jiri obere ụda na okwu egwuri egwu.[1]
Ịma agụ na ide nke ndị na-apụta apụta dị oke mkpa na agụmakwụkwọ nwata n'ihe nke nyocha na-egosi na ụmụaka na-amụta nkà nke na-akwadebe ha ịma agụ ihe ọtụtụ afọ tupu ha amalite ụlọ akwụkwọ.[1]