![cover image](https://wikiwandv2-19431.kxcdn.com/_next/image?url=https://upload.wikimedia.org/wikipedia/commons/thumb/a/a3/King_Alcohol_and_his_Prime_Minister.jpg/640px-King_Alcohol_and_his_Prime_Minister.jpg&w=640&q=50)
Ịñụbiga mmanya oke
From Wikipedia, the free encyclopedia
Ịṅụbiga mmanya ókè, nke a makwaara dị ka Aṅụrụma na Nsogbu Imeto Mmanya na-aba n'anya (AUD), [1] bụ, ịṅụ mmanya na-egbu egbu maọbụ mmanya na -aba n'anya ọ bụla nke na-akpata nsogbu isi mgbaka ma ọ bụ nke ahụike. [14][2][4] E kewa bụrụ nsogbu ịṅụbiga mmanya ókè ahụ n'ụdị abụọ: ịmetommanya na - egbu egbu na Ị dabere na mmanya na -aba na- anya [3][15] N'ihe gbasara ahụike, a na-ekwu na ịṅụbiga mmanya ókè bụ mgbe mmadụ mere ihe abụọ ma ọbụ karịa n'ime ọnọdụ ndị a : mmadụ na-aṅụ mmanya na-aba n'anya buru ibu ogologo oge, na ọ kweghị ya akwusizi ọ na-esiri ya ike , iji ya eme ihe na-eme ka ọ ghara ịrụzu ọrụ, iji ya na-eme nsogbu mmekọrịta mmadụ na ibe ya, iji ya mee ihe na-akpata nsogbu, ịhapụ ya na ọnọdụ ahụike, ịkwụsị ya na-ewere ọnọdụ dị ize ndụ.[3] ịṅụbiga mmanya ókè na emetụta akụkụ ahụ niile , mana ọ na-emetụta karị ụbụrụ, obi, imeju, pancreas na usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ. [4][5] Ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịkpata ọrịa uche, delirium tremens, Wernicke-Korsakoff syndrome, ịkụ obi na-adịghị mma, mmeghachi omume na-adịghị ike, cirrhosis imeju na ohere cancer. [4][6][16] Ịṅụ mmanya mgbe nwanyị dị 'ime nwere ike ịkpata nsogbu nwammanya na-aba n'anya. [3] Ụmụ nwanyị na-enwekarị mmetụta na-emerụ ahụ nke mmanya na-aba n'anya karịa ụmụ nwoke, makana n'ihi na ahụ ha adịghị arọ ka nke umu nwoke ikike dị ala nke ịmịkọrọ mmanya, na oke abụba dị elu.[11]
Alcoholism | |
---|---|
Other names | Alcohol dependence syndrome, alcohol use disorder (AUD)[1] |
![]() | |
"King Alcohol and His Prime Minister" Àtụ:Circa | |
Symptoms | Drinking large amounts of alcohol over a long period, difficulty cutting down, acquiring and drinking alcohol taking up a lot of time, usage resulting in problems, withdrawal occurring when stopping[2] |
Complications | Mental illness, delirium, Wernicke–Korsakoff syndrome, irregular heartbeat, cirrhosis of the liver, cancer, fetal alcohol spectrum disorder, suicide[3][4][5][6] |
Duration | Long term[2] |
Causes | Environmental and genetic factors[4] |
Risk factors | Stress, anxiety, inexpensive, easy access[4][7] |
Diagnostic method | Questionnaires, blood tests[4] |
Treatment | Alcohol detoxification typically with benzodiazepines, counselling, acamprosate, disulfiram, naltrexone[8][9][10] |
Frequency | 208 million / 4.1% adults (2010)[11][12] |
Deaths | 3.3 million / 5.9%[13] |
Gburugburu ebe obibi na mkpụrụ ndụ bụ ihe abụọ metụtara ịṅụbiga mmanya ókè, na ihe dị ka ọkara ihe ize ndụ a na-ekwu na ọ bụ nke ọ bụla.[4] Onye nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ nwanne ya nwoke na-aṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịghọ onye aṅụrụma okpukpu atọ karịa onye enweghị onye anurima [1] Ihe ndị metụtara gburugburu ebe obibi gụnyere mmetụta mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ọdịbendị na omume.[17] Ọnọdụ nrụgide dị elu na nchegbu, yana ọnụ ala mmanya na-aba n'anya na ịdị mfe ịnweta, na-eme ka ihe ize ndụ ahụ dịkwuo elu. [1] [7] Ndị mmadụ nwere ike ịga n'ihu na-aṅụ mmanya iji gbochie ma ọ bụ melite mgbaàmà nke ịkwụsị.[1] Mgbe mmadụ kwụsịrị ịṅụ mmanya na-aba n'anya, ha nwere ike ịnwe ọkwa dị ala nke mmanya ruo ọtụtụ ọnwa.[1] N'ihe gbasara ọgwụ, a na-ewere ịṅụbiga mmanya ókè dị ka ọrịa anụ ahụ na nke uche. [18][19] Ajụjụ na Nnyocha ọbara ụfọdụ nwere ike ịchọpụta ịṅụbiga mmanya ókè.[1][20] A na-anakọta ozi ndị ọzọ iji kwado nchọpụta ahụ.[1] Ntuziaka anaghị agụnye ihe karịrị ihe ọṅụṅụ 2 kwa izu.[21]
A ga - akwụsị ịṅụbiga mmanya ókè site na ịchịkwa na igbochi ire mmanya na-aba n'anya, ịtụ ụtụ isi mmanya na-egbu egbu iji mee ka ọnụahịa ya dị elu, na inye ọgwụgwọ adịghị ọnụ ala.[22] Ọgwụgwọ nke ịṅụbiga mmanya ókè nwere ike ịnwe ụdị dị iche iche.[9] N'ihi nsogbu ahụike nke nwere ike ime n'oge ịpụ n'anya, a ga-eji nlezianya chịkwaa ọgwụ ọjọọ mmanya.[2] Otu usoro a na-e iji ọgwụ ya bụ benzodiazepine, dị ka diazepam.[2] Enwere ike inye ndị a mgbe a nabatara ha n'ụlọ ọrụ nlekọta ahụike ma ọ bụ mgbe ụfọdụ mgbe mmadụ nọgidere na obodo na nlekọta chiri anya.[2] Ọrịa uche ma ọ bụ ihe ndị ọzọ riri ahụ nwere ike ime ka ọgwụgwọ a ka osie ike.[23] Mgbe ewepụchara nsị, a na-eji ọgwụgwọ otu ma ọ bụ ìgwè nkwado enyere aka igbochi mmadụ ịlaghachi ịṅụbiga mmanya oke. [8][24] Otu n'ime ndị otu na akwado nke a bụ ụdị nkwado a bụ Alcoholics Anonymous . [25] A pụkwara iji ọgwụ acamprosate, disulfiram ma ọ bụ naltrexone mee ihe iji gbochie ịṅụ mmanya ọzọ.[10]
Òtù Ahụ Ike Ụwa Kwuru na afọ 2010, na e nwere nde mmadụ 208 na-aṅụbiga mmanya ókè n'ụwa niile (4.1% nke ndị mmadụ karịrị afọ iri na ise). [11][12] Na afọ 2015 na United States, ihe dị ka nde 17 (7%) nke ndị okenye na nde 0.7 (2.8%) nke ndị dị afọ iri na abụọ ruo iri na asaa na-emetụta.[13] Ịṅụbiga mmanya ókè bụ ihe a na-ahụkarị n'etiti ụmụ nwoke na ndị na-eto eto, ọ naghịkwa ahụkebe ya n'etiti ndị agadi.[4] Anaghị ahukari ya na mba Afrịka (1.1% nke ndị bi na ya) e nwere ọnụ ọgụgụ kachasị elu n'Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe (11%). [4] Ịṅụbiga mmanya ókè kpatara ọnwụ 139,000 na afọ 2013, site na ọnwụ 112,000 na 1990. [26] A na-eche na nde mmadụ 3.3 nwụrụ (5.9% nke ọnwụ niile) bụ n'ihi mmanya na-aba n'anya maọbụ ịṅụbiga mmanya ókè.3] Ịṅụbiga mmanya ókè na-eji ihe dịka afọ iri ebelata ndụ mmadụ .[27] A na-eji ọtụtụ okwu, ụfọdụ bụ okwu mkparị wee na akọwa maọbụ na akpọ. ndị na anubiga mmanya ókè; okwu ndị ahụ gụnyere ọnyà na-ahapụ mmanya, onye na-egbu egbu, anurima,onye na'anya na onye na-adịghị ahụkebe.[28] N'afọ 1979, Òtù Ahụ Ike Ụwa kwụsịrị ịkpọ ndị anurima ndị na "aṅubiga mmanya ókè" maka na okwu ahụ ezie ezi kama ha ahọrọ "ọrịa na-adabere na mmanya". [29]